30. Umu Magbish, ọgu asa na iri na isi.
31. Umu Ilam nke-ọzọ, nnù atọ na ọgu abua na iri na anọ.
32. Umu Harim, ọgu iri-na-isi.
33. Umu Lod na Hadid na Ono, nnù na ọgu iri-na-isi na ise.
34. Umu Jeriko, ọgu iri-na-asa na ise.
35. Umu Senaa, nnù iteghete na orú na iri.
36. Ndi-nchu-àjà: umu Jedaia, nke ulo Jeshua, nnù abua na ọgu asatọ na iri na atọ.