Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezra 1:4-10 Bible Nso (IGBOB)

4. Ma onye ọ bula nke fọduru afọdu, site n'ebe nile ebe onye ahu nọ dika ọbìa, ka ndikom nke ebe-ya were ọla-ọcha na ọla-edo na àkù na anu-ulo, ya na onyinye-afọ-ofufo-ha nke diri ulo Chineke nke di na Jerusalem, yere ya aka.

5. Ndi-isi ulo nke ndi bu nna Juda na Benjamin, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, bú onye ọ bula Chineke kpọtere mọ-ya, we bilie irigo iwu ulo Jehova nke di na Jerusalem.

6. Ndi nile nke nọ ha buruburu we were ihe ọla-ọcha na ọla-edo na àkù na anu-ulo na ihe di oké ọnu-ahia, nāgughi ihe nile enyere n'afọ-ofufo, me ka aka-ha di ike.

7. Eze, bú Sairọs, chiputa-kwa-ra ihe ulo Jehova, nke Nebukadneza chipuru na Jerusalem tiye n'ulo ndi-chi-ya:

8. Sairọs, bú eze Peasia, we chiputa ha site n'aka Mitredat, bú odozi-àkù, gua ha nye Sheshbaza, bú onye-isi Juda.

9. Nka bu kwa ọnu-ọgugu-ha: orú ọkwa ọla-edo na iri, na nnù ọkwa ọla-ọcha abua na ọgu iri, na orú mma na iteghete;

10. orú ọkwa ntà ọla-edo na iri, na nnù ọkwa ntà ọla-ọcha na iri nke-abua di iche, na nnù ihe ọzọ abua na ọgu iri.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezra 1