Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 9:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. O we kpọ òkù na ntim abua n'oké olu, si, Bianu nso, unu ndi-nlekọta nke obodo, onye ọ bula ya jide kwa ihe o ji bibi madu n'aka-ya.

2. Ma, le, ndikom isi nēsi n'uzọ nke ọnu-uzọ-ama di n'elu, nke nēche iru n'Ugwu, bia, onye ọ bula nējide kwa anyu-ike-agha-ya n'aka-ya; otù nwoke ọzọ di kwa n'etiti ha nke yiri uwe ọcha, mpi ink nke ode-akwukwọ di kwa n'úkwù-ya. Ha we ba, guzo n'akuku ebe-ichu-àjà nke ọla.

3. Ma ebube nke Chineke nke Israel siri n'elu cherub ahu nke ọ di n'elu ya rigorue nbata-uzọ nke ulo ahu: O we kpọ nwoke ahu nke yiri uwe ọcha, nke nwere mpi ink nke ode-akwukwọ n'úkwù-ya, òkù.

4. Jehova we si ya, Gabiga n'etiti obodo a, n'etiti Jerusalem, ka akàrà n'egedege-iru nke ndi ahu ndi nēze ume ndi nāsu kwa ude n'ihi ihe-árú nile nke anēme n'etiti ya.

5. Ma ndikom isi ahu ka Ọ siri na ntim abua, Sonu ya gabiga n'obodo a, tib͕u kwa: anya-unu emela ebere, unu enwe-kwa-la ọmiko:

6. b͕usisianu okenye na okorọbia na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke na umu-ntakiri na ndinyom: ma unu abiarula nso onye ọ bula nke akàrà ahu di ya n'iru; ma n'ebe nsọm ka unu gēsi malite. Ha we malite n'etiti ndi-okenye ndi nọ n'iru ulo ahu.

7. O we si ha, Meruanu ulo a, me ka ndi eb͕uru eb͕u ju ogige-ya nile: puanu. Ha we pua, tib͕ue n'obodo.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 9