30. Ma ndia bu ọpupu obodo Jerusalem nka; n'akuku Ugwu nnù ami iri-na-otù na ọgu ise n'ọtùtù:
31. ọnu-uzọ-ama nile nke obodo gādi ka aha ebo nile nke Israel si di; ọnu-uzọ-ama atọ n'akuku Ugwu: ọnu-uzọ-ama Reuben, otù; ọnu-uzọ-ama Juda, otù; ọnu-uzọ-ama Livai, otù:
32. n'akuku Iru-anyanwu kwa nnù ami iri-na-otù na ọgu ise; na ọnu-uzọ-ama atọ: bú ọnu-uzọ-ama Josef, otù; ọnu-uzọ-ama Benjamin, otù; ọnu-uzọ-ama Dan, otù:
33. n'akuku Ndida kwa nnù ami iri-na-otù na ọgu ise n'ọtùtù; na ọnu-uzọ-ama atọ: ọnu-uzọ-ama Simeon, otù; ọnu-uzọ-ama Isaka, otù; ọnu-uzọ-ama Zebulun, otù:
34. n'akuku Ọdida-anyanwu nnù ami iri-na-otù na ọgu ise, na ọnu-uzọ-ama atọ ha: ọnu-uzọ-ama Gad, otù; ọnu-uzọ-ama Asha, otù; ọnu-uzọ-ama Naftali, otù.
35. Buruburu-ya gādi orú nnù ami uzọ abua na nnù ise: ma aha obodo ahu site n'ubọ̀chi ahu gābu, Jehova nọ n'ebe ahu.