Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 48:22-35 Bible Nso (IGBOB)

22. Ọzọ, site n'ihe-onwunwe nke ndi Livai, site kwa n'ihe-onwunwe nke obodo, n'etiti ala nke onye-isi nwere, n'etiti ókè-ala Juda na ókè-ala Benjamin, onye-isi gēnwe nke ahu.

23. Ma ebo nile nke fọduru: site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Benjamin, otù òkè.

24. N'akuku ókè-ala Benjamin, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Simeon, otù òkè.

25. N'akuku ókè-ala Simeon, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Isaka, otù òkè.

26. N'akuku ókè-ala Isaka, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Zebulun, otù òkè.

27. N'akuku ókè-ala Zebulun, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Gad, otù òkè.

28. Ma n'akuku ókè-ala Gad, n'akuku Ndida, nke nēche iru na Ndida, ókè-ala gēsite ọbuná na Tema rue miri Meribat-kedesh, rue miri-iyi Ijipt, rue oké osimiri uku.

29. Nka bu ala ahu nke unu gēme ka ọ dayere ebo nile nke Israel n'ihe-nketa, ọ bu kwa ndia bu òkè-ha; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

30. Ma ndia bu ọpupu obodo Jerusalem nka; n'akuku Ugwu nnù ami iri-na-otù na ọgu ise n'ọtùtù:

31. ọnu-uzọ-ama nile nke obodo gādi ka aha ebo nile nke Israel si di; ọnu-uzọ-ama atọ n'akuku Ugwu: ọnu-uzọ-ama Reuben, otù; ọnu-uzọ-ama Juda, otù; ọnu-uzọ-ama Livai, otù:

32. n'akuku Iru-anyanwu kwa nnù ami iri-na-otù na ọgu ise; na ọnu-uzọ-ama atọ: bú ọnu-uzọ-ama Josef, otù; ọnu-uzọ-ama Benjamin, otù; ọnu-uzọ-ama Dan, otù:

33. n'akuku Ndida kwa nnù ami iri-na-otù na ọgu ise n'ọtùtù; na ọnu-uzọ-ama atọ: ọnu-uzọ-ama Simeon, otù; ọnu-uzọ-ama Isaka, otù; ọnu-uzọ-ama Zebulun, otù:

34. n'akuku Ọdida-anyanwu nnù ami iri-na-otù na ọgu ise, na ọnu-uzọ-ama atọ ha: ọnu-uzọ-ama Gad, otù; ọnu-uzọ-ama Asha, otù; ọnu-uzọ-ama Naftali, otù.

35. Buruburu-ya gādi orú nnù ami uzọ abua na nnù ise: ma aha obodo ahu site n'ubọ̀chi ahu gābu, Jehova nọ n'ebe ahu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 48