Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 46:2-14 Bible Nso (IGBOB)

2. Onye-isi gēsi kwa n'uzọ uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama n'èzí bata, guzo n'akuku akuku-ọnu-uzọ nke ọnu-uzọ-ama, ndi-nchu-àjà gēdozi kwa àjà-nsure-ọku-ya, na àjà-udo-ya nile, ọ gākpọ kwa isi ala na nbata-uzọ nke ọnu-uzọ-ama, we pua: ma agaghi-emechi ọnu-uzọ-ama rue anyasi.

3. Ndi ala nka gākpọ kwa isi ala n'oghere ọnu-uzọ-ama ahu n'iru Jehova n'ubọchi-izu-ike nile, na n'ọnwa ọhu nile.

4. Ma àjà-nsure-ọku nke onye-isi gēweta nso Jehova n'ubọchi-izu-ike bu umu-aturu isi zuru okè na otù ebulu zuru okè;

5. onyinye-inata-iru-ọma bu kwa otù ephah bayere ebulu ahu, ọ gētiye kwa n'umu-aturu onyinye-inata-iru-ọma, bú onyinye nke aka-ya, ya na manu, otù hin diri otù ephah.

6. Ma n'ubọchi ọnwa ọhu ọ gābu nwa-oke-ehi zuru okè, na umu-aturu isi, na otù ebulu, ihe zuru okè ka ha gābu:

7. ọ bu kwa otù ephah etiyere n'oke-ehi ahu, na otù ephah etiyere n'ebulu ahu, na ihe etiyere n'umu-aturu ahu dika aka-ya gēru, na manu, otù, hin otù ephah, ka o gēji dozie onyinye-inata-iru-ọma.

8. Ma mb͕e onye-isi-unu gābata, uzọ uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama ahu ka ọ gēsi bata, ọ bu kwa uzọ-ya ka ọ gēsi pua.

9. Ma mb͕e ndi ala nka gābia n'iru Jehova nime mb͕e di iche iche akara àkà, onye nēsi uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke Ugwu bata ikpọ isi ala gēsi uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke Ndida pua; ma onye nēsi uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke Ndida bata gēsi uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke Ugwu pua: ọ gaghi-esi uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke o siri bata laghachi, kama otù iru ahu ka ọ gāpu.

10. Ma onye-isi, ọ bu n'etiti ha, mb͕e ha nābata, ka o gēso bata; ọzọ, mb͕e ha nāpu, ha gāpu n'otù.

11. Ọzọ, n'ememe nile na nime mb͕e nile akara àkà onyinye-inata-iru-ọma gābu otù ephah otù oke-ehi, otù ephah otù ebulu, ọ gētiye kwa n'umu-aturu onyinye aka-ya, na manu, otù hin otù ephah.

12. Ma mb͕e onye-isi gēdozi àjà-afọ-ofufo, ma ọ bu àjà-nsure-ọku ma-ọbu àjà-udo, iburu Jehova onyinye-afọ-ofufo, agēmeghere ya ọnu-uzọ-ama ahu nke nēche iru n'Iru-anyanwu, ọ gēdozi kwa àjà-nsure-ọku-ya na àjà-udo-ya nile, dika o si eme n'ubọchi-izu-ike: ọ gāpu kwa, ewe mechie ọnu-uzọ-ama mb͕e ọ pusiri.

13. Ọzọ, otù nwa-aturu nke b͕ara otù arọ nke zuru okè ka i gēdozi ibu àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova kwa-ubọchi: kwa-ututu kwa-ututu ka i gēdozi ya.

14. I gēdozi-kwa-ra ya onyinye-inata-iru-ọma kwa-ututu kwa-ututu, otù uzọ n'uzọ isi nke otù ephah, na manu, otù uzọ n'uzọ atọ nke otù hin, iji gwọ utu ọka flour; ọ bu onyinye-inata-iru-ọma anēnye Jehova mb͕e nile n'ukpuru ebighi-ebi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 46