Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 46:15-24 Bible Nso (IGBOB)

15. Otú a ka ha gēdozi nwa-aturu ahu, na onyinye-inata-iru-ọma ahu, na manu ahu, kwa-ututu kwa-ututu, ibu àjà-nsure-ọku mb͕e nile.

16. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mb͕e onye-isi gēnye onye ọ bula n'umu-ya ndikom onyinye, ihe-nketa-ya ka ọ bu, umu-ya ndikom gēnwe ya; ihe-onwunwe-ha ka ọ bu n'ihe-nketa.

17. Ma mb͕e ọ gēnye otù onye nime ndi-orù-ya onyinye nke sitere n'ihe-nketa-ya, ọ gābu kwa nke ya rue arọ izilaga orù ka o nwere onwe-ya; onyinye ahu we laghachikute onye-isi; nání na ihe-nketa-ya, bú ihe-nketa umu-ya ndikom, nke ha ka ọ gābu.

18. Ọzọ, onye-isi agaghi-ewere ihe ọ bula n'ihe-nketa nke ndim, inapu ha ihe-nketa-ha n'ike; ihe nke si n'ihe-onwunwe-ya puta ka ọ gēme ka umu-ya ndikom keta: ka ndim we ghara ib͕asa, onye ọ bula ọ pua n'ihe-onwunwe-ya.

19. O we me ka m'si na nbata ahu nke di n'akuku ọnu-uzọ-ama ahu bata n'ime-ulo nsọ nile nke ndi-nchu-àjà, nke nēche iru n'Ugwu; ma le, n'ebe ahu ka otù ebe di n'azu ya chere iru n'Ọdida-anyanwu.

20. O we sim, Nka bu ebe ahu ebe ndi-nchu-àjà gēsi anu àjà-ikpe-ọmuma na anu àjà-nmehie, ebe ha gēsi onyinye-inata-iru-ọma; ka ha we ghara iweputa ha n'ogige di n'èzí, ido ndim nsọ.

21. O we me ka m'puta ba n'ogige di n'èzí, o we me ka m'gabiga na nkuku anọ nke ogige ahu; ma, le, otù ogige di na nkuku ọ bula nke ogige ahu n'otù n'otù.

22. Nime nkuku anọ nke ogige ahu ka ogige di nke ejikọtara ejikọta, ọgu cubit abua n'ogologo, orú cubit na iri n'obosara: otù ọtùtù diri ha anọ nime nkuku anọ ahu.

23. Ọzọ, otù ariri ulo di buruburu nime ha, buruburu ha anọ, bú ulo ewuru nwere ebe-isi-ite n'okpuru ariri nile buruburu.

24. O we sim, Ndia bu ulo nke ndi nēsi ite, ebe ndi-oje-ozi nke ulo a gēsi anu àjà ndi Israel.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 46