Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 45:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma mb͕e unu gēme ka ala-unu dayere onwe-unu n'ihe-nketa, unu gēbuliri Jehova àjà-nbuli, bú otù òkè di nsọ nke ala ahu: ogologo-ya gādi orú nnù amì uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri n'ogologo, obosara-ya gādi kwa orú nnù na nnù ise: ihe nsọ ka ọ gābu n'ókè-ala-ya nile buruburu.

2. Site n'ala nka nnù ami na ọgu n'ogologo na nnù na ọgu ise n'obosara gādiri ebe nsọm, ọ gēnwe akuku anọ rara nrata buruburu; ma ọgu cubit abua na iri gāburu ya ebe-ita-nri buruburu.

3. Site n'ọtùtù a ka i gātù kwa, ogologo nke gādi orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri, na obosara nke gādi orú nnù ami na nnù ise: ọ bu kwa nime ya ka ebe nsọ, nke bu ebe di nsọ kachasi ebe nsọ nile, gādi.

4. Òkè nsọ nke ala ahu ka ọ bu; ndi-nchu-àjà, bú ndi-oje-ozi nke ebe nsọ, gēnwe ya, bú ndi nābia nso ijere Jehova ozi; ọ gābu-kwa-ra ha ebe ulo nile ha gādi, na ebe nsọ diri ebe nsọ nkem.

5. Orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri n'ogologo, na orú nnù ami na nnù ise n'obosara, gādiri ndi Livai, bú ndi-oje-ozi nke ulom, ighọrọ ha ihe-onwunwe, orú ime-ulo.

6. Ihe-onwunwe nke obodo a ka unu gēnye kwa, nnù ami iri-na-abua na ọgu iri ka obosara-ya gādi, ogologo-ya gādi kwa orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri, n'akuku àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ: ulo Israel nile gēnwe ya.

7. Ihe onye-isi-unu nwere gādi kwa n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ nke àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, na nke ihe-onwunwe nke obodo a, n'iru àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, na n'iru ihe-onwunwe nke obodo a, n'akuku Ọdida-anyanwu chere iru n'Ọdida-anyanwu, na n'akuku Iru-anyanwu chere iru n'Iru-anyanwu: ogologo-ya gādi kwa n'akuku otù nime òkè ndia, site n'ókè-ala Ọdida-anyanwu rue ókè-ala Iru-anyanwu.

8. N'ala nka ọ gāburu ya ihe-onwunwe n'Israel: ndi-isim agaghi-eme kwa ndim ihe-ike ọzọ; kama ala nka ka ha gēnye ulo Israel dika ebo nile ha si di.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 45