Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 44:19-28 Bible Nso (IGBOB)

19. Ma mb͕e ha nāpu n'ogige di n'èzí, bú ogige di n'èzí ipukuru ndi Israel, ha gēyipu uwe nile ha, nke onwe-ha nēje ozi nime ha, ha gādọba kwa ha n'ime-ulo nsọ ndia, yiri uwe ọzọ, ka ha we ghara iji uwe-ha do ndi Israel nsọ.

20. Ha agaghi-akọpu kwa isi-ha, ha agaghi-eme kwa ka agiri-isi-ha to ogologo; nání nkpacha ka ha gākpacha isi-ha.

21. Ọ dighi kwa manya-vine onye-nchu-àjà ọ bula gāṅu, mb͕e ha nābata n'ogige di nime.

22. Ọ dighi kwa nwanyi nke di-ya nwuru, ma-ọbu nwanyi nke achupuru achupu, ka ha gālu na nwunye: kama umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke ndi sitere na nkpuru ulo Israel, ma-ọbu nwanyi di-ya nwuru nke bu nwunye onye-nchu-àjà nwuru anwu, ka ha gālu.

23. Ọ bu kwa ndim ka ha gēzí ihe di iche n'etiti ihe nsọ na ihe nādighi nsọ, ọ bu kwa ihe di iche n'etiti ihe di ọcha na ihe ruru árú ka ha gēme ka ha mara.

24. Ọzọ, n'ise-okwu ọ bula ndi ahu gēguzo ikpe ikpe; ikpém nile ka ha gēji kpe ya: ọ bu kwa iwum nile na ukpurum nile nime mb͕em nile akara àkà ka ha gēdebe; ubọchi-izu-ikem nile ka ha gēdo nsọ.

25. Ọ dighi kwa madu nke nwuru anwu ka ha gābiaru nso imeru onwe-ha: ma otú ọ di, ha gēmeru onwe-ha n'ihi nna, na n'ihi nne, na n'ihi nwa-nwoke, na n'ihi nwa-nwanyi, na n'ihi nwa-nne-nwoke, na n'ihi nwa-nne-nwanyi nke nēnweghi di.

26. Mb͕e emesiri ka ọ di ọcha, ọ bu kwa ubọchi asa ka agāguru ya.

27. Ma n'ubọchi ọ gābata n'ebe nsọ, n'ogige di nime, ije ozi n'ebe nsọ, ọ gēweta àjà-nmehie-ya nso; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

28. Ọ gāghọ-kwa-ra na ihe-nketa; Mu onwem bu ihe-nketa-ha: ọ dighi kwa ihe-onwunwe unu gēnye ha n'Israel; Mu onwem bu ihe-onwunwe-ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 44