O gēru kwa, mb͕e ha batara n'ọnu-uzọ-ama nke ogige di nime, na ọ bu uwe flax ka ha gēyi; ọ dighi kwa uwe aji-anu gābiakwasi n'aru ha, mb͕e ha nēje ozi n'ọnu-uzọ-ama nke ogige di nime, na nime ulo.