Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 43:3-17 Bible Nso (IGBOB)

3. Ọ di kwa ka ọhù nke m'huru si di n'ile ya anya, dika ọhù m'huru mb͕e m'biara ibibi obodo ahu; ọhù nile di kwa ka ọhù ahu nke m'huru n'akuku osimiri Keba: m'we da kpuchie irum n'ala.

4. Ebube nke Jehova we bata nime ulo-Ya n'uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke iru-ya di n'uzọ Iru-anyanwu.

5. Mọ Chineke we buliem elu, me ka m'bata n'ogige di nime; ma le, ebube nke Jehova juputara n'ulo ahu.

6. M'we nu olu otù onye nāgwam okwu site n'ulo ahu; otù nwoke nēguzo kwa n'akukum.

7. O we sim, Nwa nke madu, nka bu ebe nke oche-ezem, na ebe nke ọbu-ukwu nke ukwum abua, ebe M'gēbi n'etiti umu Israel rue mb͕e ebighi-ebi: ulo Israel agaghi-emeru kwa aha nsọm ọzọ, ha onwe-ha, ma-ọbu ndi-eze-ha, site n'ikwa-iko-ha, na site n'ozu nile nke ndi-eze-ha n'ebe di elu ha;

8. mb͕e ha nētiye nbata-uzọ-ha n'akuku nbata-uzọ nkem, na akuku-ọnu-uzọ-ha n'akuku akuku-ọnu-uzọ nkem, ọ bu kwa nání mb͕idi di n'etiti mu na ha; ha emeruwo kwa aha nsọm site n'ihe-árú-ha nile nke ha meworo: M'we ripia ha n'iwem.

9. Ub͕u a ka ha wezuga ikwa-iko-ha na ozu nile nke ndi-eze-ha n'ebe di anya n'ebe M'nọ, M'gēbi kwa n'etiti ha rue mb͕e ebighi-ebi.

10. Gi onwe-gi, nwa nke madu, gosi ulo Israel ulo a, ka ihere ajọ omume nile ha we me ha: ka ha tù kwa ọtùtù-ya.

11. Ọ buru kwa na ihere ihe nile ha meworo eme ha, gi me ka ha mara òmùmò ulo a, na ọtùtù-ya, na ọpùpù-ya nile, na nbata-ya nile, na òmùmò-ya nile, na ukpuru-ya nile, na òmùmò-ya nile, na iwu-ya nile, de kwa ha n'akwukwọ n'anya-ha: ka ha we debe òmùmò-ya nile, na ukpuru-ya nile, me ha.

12. Nka bu iwu ulo a: n'elu ugwu-ya ókè-ala-ya nile buruburu n'akuku nile di nsọ kachasi ebe nsọ nile. Le, nka bu iwu ulo a.

13. Ma ndia bu ọtùtù ebe-ichu-àjà nime cubit: (cubit ahu bu otù cubit na otù ntù-ọbu-aka:) ala-ya bu otù cubit, ọ bu kwa otù cubit ka obosara-ya di, ókè-ya n'ọnu-ọnu-ya buruburu bu kwa otù ntù-aka: nka bu kwa ebe-ndọkwasi ebe-ichu-àjà nka.

14. Site n'ala-ya nke di n'ala rue ngwe di ala di cubit abua, obosara-ya di kwa otù cubit; ma site na ngwe dikari ntà rue ngwe dikari uku di cubit anọ, obosara-ya di kwa otù cubit.

15. Ebe-ichu-àjà onwe-ya di kwa cubit anọ; site n'ebe-ichu-àjà we rigo ka mpi anọ di kwa.

16. Ebe-ichu-àjà di cubit iri na abua n'ogologo-ya, na cubit iri na abua n'obosara-ya, ọ rara nrata n'akuku anọ ya rara nrata.

17. Ngwe-ya di kwa cubit iri na anọ n'ogologo-ya, na cubit iri na anọ n'obosara-ya n'akuku anọ ya rara nrata, ókè nke di ya buruburu di kwa nkera cubit; ala o nwere di kwa otù cubit buruburu; ihe-nrigo-ya nēche iru n'Iru-anyanwu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 43