Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 41:21-26 Bible Nso (IGBOB)

21. Ma ulo uku Chineke ahu, akuku-ọnu-uzọ-ya nwere akuku anọ ra nrata; na iru ebe nsọ ya, n'ile ya anya ọ di ka ulo uku Chineke si di n'ile ya anya.

22. Ebe-ichu-àjà-ya bu osisi, cubit atọ n'idi-elu-ya, ogologo-ya di kwa cubit abua: ọ nwe-kwa-ra nkuku-ya anọ; ogologo-ya na akuku-ya nile bu kwa osisi: o we gwam okwu, si, Nka bu table ahu nke di n'iru Jehova.

23. Ọ bu kwa ọnu-uzọ abua ka ulo uku Chineke na ebe nsọ ya nwere n'otù n'otù.

24. Ọ bu kwa ibo-ọnu-uzọ abua ka ọnu-uzọ ndia nwere n'otù n'otù, bú ibo-ọnu-uzọ abua nke nāga buruburu; ibo-ọnu-uzọ abua diri otù ọnu-uzọ, ibo-ọnu-uzọ abua di-kwa-ra ọnu-uzọ nke-ọzọ.

25. Ihe emere n'elu ha, bú n'elu ibo-ọnu-uzọ nile nke ulo uku Chineke, bu kwa cherubim na nkwu, dika nke emere n'elu mb͕idi-ya nile; nbata-uzọ nke osisi di kwa n'iru uzọ-nbata-ya n'èzí.

26. Window emechiri emechi na nkwu di kwa n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ, n'akuku nile nke uzọ-nbata: otù a ka ulo ntà akuku nile nke ulo ahu na nbata-uzọ-ya nile di.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 41