Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 4:8-17 Bible Nso (IGBOB)

8. Ma, le, atukwasim i udọ̀, i we ghara isi n'otù akuku-aru-gi chighari n'akuku-aru-gi ọzọ, rue mb͕e i dinazuworo ubọchi nile nke nnọchigide-n'agha-gi.

9. Ọzọ, gi onwe-gi were n'onwe-gi ọka wheat, na ọka barley, na akidi, na lentil, na ọka millet, na spelt, tiye ha n'otù ihe, were ha mere onwe-gi achicha; ka ọnu-ọgugu ubọchi ra nke gi onwe-gi were akuku-gi dina ala, bú ọgu ubọchi iri-na-iteghete na iri, ka i gēri ya.

10. Ọzọ, ihe-oriri-gi nke i gēri, aganātù ya atù, orú shekel gādiri otù ubọchi: site n'otù mb͕e rue mb͕e ọzọ ka i gēri ya.

11. Ọ bu kwa miri nke anātù atù ka i gāṅu, otù uzọ n'uzọ iri nke otù hin: site n'otù mb͕e rue mb͕e ọzọ ka i gāṅu ya.

12. Ọzọ, dika ob͕e achicha barley ka i gēri ya, achicha ahu ka i gēji kwa ǹsí madu nyuru sie n'anya-ha.

13. Jehova we si, Ọbuná otú a ka umu Israel gēri nri-ha ruru árú, n'etiti mba nile ebe M'gāchuga ha.

14. M'we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! le, emerughi nkpuru-obim: erighkwam ihe nwuru n'onwe-ya, ma-ọbu ihe anu dọb͕uru, site na mb͕e m'di na nwata we rue ub͕u a; ọ dighi kwa anu nke bu ihe-árú bàworo n'ọnum.

15. O we sim, Le, enyewom i ǹsí ehi n'ọnọdu ǹsí madu, i gēme kwa achicha-gi n'elu ya.

16. O we sim, Nwa nke madu, le, M'gaje ib͕aji nkpa-n'aka, bú achicha, nime Jerusalem: ha ewe rie achicha n'ọtùtù na nime ncheb͕u; ha gāṅu kwa miri n'ọtùtù na n'anya ọ nēju ha:

17. ka nri na miri we kọ ha, ka o we ju kwa ha anya, otù onye n'aru ibe-ya, ha ewe ta aru n'ajọ omume-ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 4