Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 39:20-28 Bible Nso (IGBOB)

20. Afọ inyinya na ub͕ọ-ala na ndi-dike na ndi-agha nile gēju unu table nkem; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

21. M'gēdo kwa nsọpurum n'etiti mba nile, mba nile gāhu kwa ihe M'kpere n'ikpe nke M'meworo, na akam nke M'tukwasiworo ha.

22. Ulo Israel ewe mara na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-ha, site n'ubọchi ahu we ga n'iru.

23. Mba nile gāma kwa na ọ bu n'ihi ajọ omume-ha ka emere ka ulo Israel je biri n'ala ọzọ; n'ihi na ha mekpuru emekpu megidem, M'we zonari ha irum: M'we nye ha n'aka ndi nākpab͕u ha, ha we site na mma-agha, ha nile.

24. Dika iru-árú-ha si di na dika njehie nile ha si di, otú a ka M'mere ha: M'we zonari ha irum.

25. N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Ub͕u a ka M'gēme ka ndi Jekob adọtara n'agha lata, M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru ulo Israel nile; M'gēkwo-kwa-ra aha nsọm ekworo.

26. Ha gēbu kwa ihere-ha, na nmekpu nile ha nke ha mekpuworo megidem, mb͕e ha gēbi n'ala-ha na ntukwasi-obi, mb͕e ọ gaghi-adi onye ọ bula nēme ka ha ma jijiji;

27. mb͕e M'gēmewori ka ha si n'etiti ndi nile di iche iche lata, mb͕e M'gāchikọputawo ha-ri n'ala nile nke ndi-iro-ha, ewe dom nsọ nime ha n'anya ọtutu mba.

28. Ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-ha, ebe M'mere ka ha je biri n'ala ọzọ n'etiti mba nile, M'we chikọba ha n'ala-ha; M'gaghi-eme kwa ka onye ọ bula nime ha fọdu n'ebe ahu ọzọ;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 39