Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 39:2-17 Bible Nso (IGBOB)

2. M'gēchighari kwa gi, duru gi, me ka i si n'akuku nile dikarisiri anya nke Ugwu rigota; M'gēme kwa ka i bia n'elu ugwu nile nke Israel:

3. M'gētipu kwa uta-gi n'aka-ekpe-gi, me ka àkú-gi nile dapu n'aka-nri-gi.

4. N'elu ugwu nile nke Israel ka i gāda, gi onwe-gi, na usu-ndi-agha-gi nile, na ndi di iche iche ndi nēso gi: udele nile di iche iche na anu ọhia ka M'gēwere gi nye, ka ha we rie gi.

5. N'ọhia ka i gāda: n'ihi na Mu onwem ekwuwo, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

6. M'gēziga ọku n'aru Megog na n'aru ndi bi n'agwe-etiti nile na ntukwasi-obi: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

7. Aha nsọm ka M'gēme kwa ka amara ya n'etiti ndim, bú Israel; M'gaghi-ekwe kwa ọzọ ka eme ka aha nsọm ghara idi nsọ: mba nile ewe mara na Mu onwem bu Jehova, Onye nsọ nọ n'Israel.

8. Le, ọ nābia, ọ gēme kwa, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta); nka bu ubọchi ahu nke M'kwuworo okwu bayere ya.

9. Ndi bi n'obodo nile nke Israel gāpu kwa, chiri ihe-agha funwue ọku sure ha, ma ọta ma ọta uku, ma uta ma àkú, ma nkpa-n'aka, ma ube, ha gāchiri ha funwue ọku arọ asa:

10. ha ewe ghara ikpata nkú n'ọhia, ha agaghi-eb͕utu kwa nkú n'oké ọhia; n'ihi na ha gāchiri ihe-agha funwue ọku: ha gākwata kwa ndi-nkwata-ha, luta kwa ndi-nluta-ha n'agha; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

11. O gēru kwa n'ubọchi ahu, na M'gēnye Gog otù ebe ílì ozu n'Israel, bú ndagwurugwu nke ndi-ngabiga n'akuku Iru-anyanwu nke oké osimiri: ihe nēb͕ochibido ndi-ngabiga ka ọ gābu: ha gēlì kwa n'ebe ahu Gog na ìgwè ndi-ya nile: ha ewe kpọ ya, Ndagwurugwu Hamon-Gog.

12. Ma ọnwa asa ka ulo Israel gānọ nēlì ha, ka ha we me ka ala-ha di ọcha.

13. E, ndi nile nke ala ahu gēli ha; ọ gāghọ-kwa-ra ha aha, n'ubọchi agāsọpurum; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

14. Ọ bu kwa ndi ganalu ọlu mb͕e nile ka ha gēkewaputa, ndi ganāgabiga n'ala-ha nēlì ndi-ngabiga ahu, bú ndi fọduru n'elu ala, ime ka ọ di ọcha: n'ọgwugwu ọnwa asa ka ha gāchọputa.

15. Ma ndi nāgabiga n'ala gāgabiga; mb͕e onye ọ bula gāhu ọkpukpu madu, ọ gēwu kwa ihe-iriba-ama n'akuku ya, rue mb͕e ndi nēlì ozu gēlìwo ya-ri na ndagwurugwu Hamon-Gog.

16. Ọzọ kwa, aha nke otù obodo gābu Hamona. Ha ewe me ka ala ahu di ọcha.

17. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Si nnunu nile di iche iche, si kwa anu ọhia nile ọ bula, Chikọtanu onwe-unu, bia; zukọputanu n'akuku nile di buruburu, n'ihi àjàm nke Mu onwem nāchuru unu, bú àjà di uku M'nāchu n'elu ugwu nile nke Israel, ka unu we rie anu, ṅu kwa ọbara.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 39