Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 39:13-17 Bible Nso (IGBOB)

13. E, ndi nile nke ala ahu gēli ha; ọ gāghọ-kwa-ra ha aha, n'ubọchi agāsọpurum; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

14. Ọ bu kwa ndi ganalu ọlu mb͕e nile ka ha gēkewaputa, ndi ganāgabiga n'ala-ha nēlì ndi-ngabiga ahu, bú ndi fọduru n'elu ala, ime ka ọ di ọcha: n'ọgwugwu ọnwa asa ka ha gāchọputa.

15. Ma ndi nāgabiga n'ala gāgabiga; mb͕e onye ọ bula gāhu ọkpukpu madu, ọ gēwu kwa ihe-iriba-ama n'akuku ya, rue mb͕e ndi nēlì ozu gēlìwo ya-ri na ndagwurugwu Hamon-Gog.

16. Ọzọ kwa, aha nke otù obodo gābu Hamona. Ha ewe me ka ala ahu di ọcha.

17. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Si nnunu nile di iche iche, si kwa anu ọhia nile ọ bula, Chikọtanu onwe-unu, bia; zukọputanu n'akuku nile di buruburu, n'ihi àjàm nke Mu onwem nāchuru unu, bú àjà di uku M'nāchu n'elu ugwu nile nke Israel, ka unu we rie anu, ṅu kwa ọbara.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 39