Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 39:1-16 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, bue amuma megide Gog, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem nēmegide gi, Gog, onye-isi nke Rosh na nke Meshek na nke Tubal:

2. M'gēchighari kwa gi, duru gi, me ka i si n'akuku nile dikarisiri anya nke Ugwu rigota; M'gēme kwa ka i bia n'elu ugwu nile nke Israel:

3. M'gētipu kwa uta-gi n'aka-ekpe-gi, me ka àkú-gi nile dapu n'aka-nri-gi.

4. N'elu ugwu nile nke Israel ka i gāda, gi onwe-gi, na usu-ndi-agha-gi nile, na ndi di iche iche ndi nēso gi: udele nile di iche iche na anu ọhia ka M'gēwere gi nye, ka ha we rie gi.

5. N'ọhia ka i gāda: n'ihi na Mu onwem ekwuwo, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

6. M'gēziga ọku n'aru Megog na n'aru ndi bi n'agwe-etiti nile na ntukwasi-obi: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

7. Aha nsọm ka M'gēme kwa ka amara ya n'etiti ndim, bú Israel; M'gaghi-ekwe kwa ọzọ ka eme ka aha nsọm ghara idi nsọ: mba nile ewe mara na Mu onwem bu Jehova, Onye nsọ nọ n'Israel.

8. Le, ọ nābia, ọ gēme kwa, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta); nka bu ubọchi ahu nke M'kwuworo okwu bayere ya.

9. Ndi bi n'obodo nile nke Israel gāpu kwa, chiri ihe-agha funwue ọku sure ha, ma ọta ma ọta uku, ma uta ma àkú, ma nkpa-n'aka, ma ube, ha gāchiri ha funwue ọku arọ asa:

10. ha ewe ghara ikpata nkú n'ọhia, ha agaghi-eb͕utu kwa nkú n'oké ọhia; n'ihi na ha gāchiri ihe-agha funwue ọku: ha gākwata kwa ndi-nkwata-ha, luta kwa ndi-nluta-ha n'agha; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

11. O gēru kwa n'ubọchi ahu, na M'gēnye Gog otù ebe ílì ozu n'Israel, bú ndagwurugwu nke ndi-ngabiga n'akuku Iru-anyanwu nke oké osimiri: ihe nēb͕ochibido ndi-ngabiga ka ọ gābu: ha gēlì kwa n'ebe ahu Gog na ìgwè ndi-ya nile: ha ewe kpọ ya, Ndagwurugwu Hamon-Gog.

12. Ma ọnwa asa ka ulo Israel gānọ nēlì ha, ka ha we me ka ala-ha di ọcha.

13. E, ndi nile nke ala ahu gēli ha; ọ gāghọ-kwa-ra ha aha, n'ubọchi agāsọpurum; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

14. Ọ bu kwa ndi ganalu ọlu mb͕e nile ka ha gēkewaputa, ndi ganāgabiga n'ala-ha nēlì ndi-ngabiga ahu, bú ndi fọduru n'elu ala, ime ka ọ di ọcha: n'ọgwugwu ọnwa asa ka ha gāchọputa.

15. Ma ndi nāgabiga n'ala gāgabiga; mb͕e onye ọ bula gāhu ọkpukpu madu, ọ gēwu kwa ihe-iriba-ama n'akuku ya, rue mb͕e ndi nēlì ozu gēlìwo ya-ri na ndagwurugwu Hamon-Gog.

16. Ọzọ kwa, aha nke otù obodo gābu Hamona. Ha ewe me ka ala ahu di ọcha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 39