Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 37:5-20 Bible Nso (IGBOB)

5. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri ọkpukpu ndia: Le, Mu onwem gaje ime ka ume ba nime unu, unu ewe di ndu.

6. M'gētiyekwasi kwa unu akwara, me ka anu-aru rigokwasi unu, M'gēkpuchi kwa unu akpukpọ-aru, tiye ume nime unu, unu ewe di ndu, we mara na Mu onwem bu Jehova.

7. M'we bue amuma dika esiri nyem iwu: otù olu we da mb͕e m'nēbu amuma, ma, le, ime-nkpatu di, ọkpukpu we biarute onwe-ha nso, ọkpukpu n'ọkpukpu nke ya.

8. M'we hu, ma, le, akwara dikwasi ha, anu-aru rigota-kwa-ra, akpukpọ-aru we kpuchie ha n'elu: ma ume adighi nime ha.

9. O we sim, Buere ifufe amuma, bue amuma, nwa nke madu, si ifufe, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Si n'ifufe anọ bia, gi ume, kukwasi ndia eb͕uru eb͕u ume, ka ha we di ndu.

10. M'we bue amuma dika O nyerem iwu, ume we ba nime ha, ha we di ndu, guzo ọtọ n'ukwu-ha, buru oké usu-ndi-agha di uku ri nne.

11. O we sim, Nwa nke madu, ọkpukpu ndia, ulo Israel nile ka ha bu: le, ha nāsi, Ọkpukpu-ayi akpọwo nku, olile-anya-ayi alawo kwa n'iyì; ebipusiwo ayi onwe-ayi.

12. N'ihi nka bue amuma, si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem gēmeghe ílì nile unu, me ka unu si n'ílì-unu rigoputa, unu ndim; M'gēme kwa ka unu bata n'ala Israel.

13. Unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'meghesiri ílì-unu, na mb͕e M'mesiri ka unu si n'ílì-unu rigoputa, unu ndim.

14. M'gētiye kwa Mọm nime unu, unu ewe di ndu, M'gēme kwa ka unu nọdu n'ala-unu: unu ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo, me ya; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

15. Okwu Jehova we ruem nti, si,

16. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, were otù osisi n'onwe-gi, de n'elu ya, Nke Juda, na nke umu Israel ndi ekekọtaworo ya na ha n'otù: were kwa osisi ọzọ, de n'elu ya, Nke Josef, osisi Efraim, na nke ulo Israel nile ndi ekekọtaworo ya na ha n'otù:

17. gi jikọta kwa ha, otù na ibe-ya, nye onwe-gi, ka ha ghọ otù osisi, ka ha we ghọ otù n'aka-gi.

18. Ma mb͕e umu ndi-gi gāgwa gi okwu, si, Ì gaghi-egosi ayi ihe ihe ndia bu n'ebe i nọ?

19. gwa ha okwu, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem gaje iwere osisi Josef nke di n'aka Efraim, na ebo nile nke Israel ndi ekekọtaworo ya na ha n'otù; M'gētiyekọ kwa ha na ya, bú osisi Juda, me ka ha ghọ otù osisi, ha ewe ghọ otù n'akam.

20. Osisi abua ahu nke i nēde ihe n'elu ha gādi kwa n'aka-gi n'anya-ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 37