Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 36:27-38 Bible Nso (IGBOB)

27. Mọ nkem ka M'gētiye nime unu, me ka ọ buru n'ukpurum nile ka unu gējeghari, ọ bu kwa ikpém nile ka unu gēdebe, me ha.

28. Unu gēbi kwa n'ala ahu nke M'nyere nna-unu-hà; unu gābu-kwa-ram otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra unu Chineke.

29. M'gāzọputa kwa unu n'iru-árú nile unu: M'gākpọ kwa ọka, me ka ọ ba uba, M'gaghi-atukwasi unu oké unwu.

30. M'gēme kwa ka nkpuru osisi na ihe-omume nke ubi ba uba, ka unu we ghara inara kwa ita-uta nke oké unwu n'etiti mba nile ọzọ.

31. Unu gēcheta kwa uzọ ọjọ nile unu, na omume nile unu nke nādighi nma; unu gāsọ kwa onwe-unu oyi n'anya-unu n'ihi ajọ omume nile unu na n'ihi ihe-árú nile unu.

32. Ọ bughi n'ihi unu ka Mu onwem nālu ọlu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), maranu nka: ka ihere uzọ nile unu me unu, ka etiye kwa unu n'ọnọdu-ihere, unu ulo Israel.

33. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ubọchi M'mere ka unu si n'ajọ omume nile unu di ọcha, n'ubọchi ahu ka M'gēme ka madu bi n'obodo nile unu, agēwu kwa ebe nile tọb͕ọrọ n'efu.

34. Ala-ubi ahu nke tọb͕ọrọ n'efu ka agālu kwa, n'ọnọdu ibu ebe tọb͕ọrọ n'efu n'anya onye ọ bula nāgabiga.

35. Ha gāsi kwa, Ala nka nke tọb͕ọrọ n'efu aghọwo ubi dika ubi Iden ab͕ara ogige; ọzọ, obodo nile nke bu nkpọnkpọ, nke tọb͕ọrọ n'efu, nke akwaturu n'ala, ha aghọwo ebe ewusiri ike nke madu bi nime ha.

36. Mba nile nke fọduru n'ala di unu buruburu gāma kwa na Mu onwem, bú Jehova, ewuwo ebe nile akwaturu akwatu, ku kwa ubi nke tọb͕ọrọ n'efu: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu, M'gēme kwa ya.

37. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọzọ, nka ka M'gēkwe ka ulo Israel juam ase bayere ya, ka M'we mere ha ya; M'gēme ka ha ba uba na madu dika ìgwè ewu na aturu.

38. Dika ìgwè ewu na aturu di nsọ, dika ìgwè ewu na aturu nke Jerusalem na mb͕e-ya nile akara àkà; otú a ka nkpọnkpọ obodo nile gējuputa na ìgwè ewu na aturu nke bu madu: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 36