Unu emeghi ka ndi aru-ha nādighi ike di ike, unu agwọghi kwa nke nāria ọria, unu ekezighi kwa ọkpukpu b͕ajiri ab͕aji, unu eweghachighi kwa nke achufuru achufu, unu achọghi kwa nke furu efu; kama n'ike na nkpab͕u ka unu zọdaworo ha.