Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 34:23-30 Bible Nso (IGBOB)

23. M'gēme kwa ka otù onye-ọzùzù-aturu biliere ha, ọ gāzù kwa ha, ọbuná orùm, bú Devid; ya onwe-ya gāzù ha, ya onwe-ya gābu-kwa-ra ha onye-ọzùzù-aturu.

24. Mu onwem, bú Jehova, gābu-kwa-ra ha Chineke, orùm, bú Devid, gābu kwa onye-isi n'etiti ha; Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu.

25. Mu na ha gāb͕a kwa ọb͕ub͕a-ndu udo, M'gēme kwa ka ajọ anu-ọhia kwusi n'ala-ha: ha gēbi n'ọzara na ntukwasi-obi, raru ura n'oké ọhia.

26. M'gēme kwa ka ha na ebe nile nke di ugwu ntàm buruburu ghọ ngọzi; M'gēme kwa ka oké miri-ozuzo zo na mb͕e-ya; oké miri-ozuzo nke ngọzi gādi.

27. Osisi ọhia gāmi kwa nkpuru-ya, ala gēme kwa ihe-ọmume-ya, ha gānọ kwa n'elu ala-ha na ntukwasi-obi; ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'tijiworo nkpọrọ nile nke yoke-ha, naputa ha n'aka ndi mere ha ka ha fè ha òfùfè.

28. Ha agaghi-abu-kwa-ra mba nile ihe-nluta-n'agha ọzọ, anu-ọhia nke uwa agaghi-eri kwa ha; ma ha gēbi na ntukwasi-obi, ọ dighi kwa onye ganēme ka ha ma jijiji.

29. M'gēme kwa ka ihe-ọkukù nke agāma aha-ya biliere ha, ha agaghi-abu kwa ndi oké unwu kpochapuworo n'ala-ha ọzọ, ha agaghi-ebu kwa ihere mba nile ọzọ.

30. Ha ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, bú Chineke-ha, nọyere ha, ha mara kwa na ha onwe-ha bu ndim, bú ulo Israel; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 34