Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 33:23-27 Bible Nso (IGBOB)

23. Okwu Jehova we ruem nti, si,

24. Nwa nke madu, ndi bi na nkpọnkpọ ebe ndia n'ala Israel nēkwu, si, Nání otù onye ka Abraham bu, o we nweta ala nka: ma ayi onwe-ayi bara uba; ayi ka enyeworo ala nka ibu ihe-nweta.

25. N'ihi nka si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Anu na ọbara-ya ka unu nēri, unu nēweli kwa anya-unu le arusi nile unu, ọbara ka unu nāwusi kwa: ọ̀ kwa ala nka ka unu gēnweta?

26. Unu eguzowo n'elu mma-agha-unu, unu emewo ihe-árú, unu emeruwo, nwoke ọ bula o merua nwunye nke nwoke-ibe-ya: ọ̀ bu kwa ala nka ka unu gēnweta?

27. Otú a ka i gāsi ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mu onwem nādi ndu, n'ezie ndi nọ na nkpọnkpọ ebe nile gāda site na mma-agha, M'gēwere kwa onye nọ n'ọhia nye anu-ọhia ka ewe ripia ya, na ndi nọ n'ebe nile ewusiri ike na n'ọb͕à nile, n'ajọ ọria nēfe efe ka ha gānwu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 33