Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 33:16-27 Bible Nso (IGBOB)

16. Nmehie-ya nile nke o mehieworo agaghi-echeta ha megide ya: ihe ekpere n'ikpe na ezi omume ka o meworo; ọ ghaghi idi ndu.

17. Ma umu ndim asiwo, Adighi-atule uzọ Onye-nwe-ayi: ma ha onwe-ha, uzọ-ha ka anādighi-atule.

18. Mb͕e onye ezi omume si n'ezi omume-ya chigharia, me ajọ omume, ọ gānwu kwa nime ha.

19. Ma mb͕e onye nēmebi iwu si na nmebi-iwu-ya chigharia, me ihe ekpere n'ikpe na ezi omume, n'ihi ihe ndia ka onye ahu gādi ndu.

20. Ma unu asiwo, Adighi-atule uzọ Onye-nwe-ayi. M'gēkpe unu ikpe, unu ulo Israel, onye ọ bula ka uzọ-ya nile si di.

21. O rue, n'arọ nke-iri-na-abua nke emere ka ayi je biri n'ala ọzọ, n'ọnwa nke-iri, n'ubọchi nke-ise nke ọnwa ahu, na otù onye nke siri na Jerusalem b͕apu biakuterem, si, Etikpọwo obodo-ayi.

22. Ma aka Jehova rurumri aru n'anyasi, tutu onye b͕apuru ab͕apu abia; O we saghe ọnum, rue mb͕e ọ biakuterem n'ututu; ewe saghe ọnum, m'we ghara ida kwa ob͕i ọzọ.

23. Okwu Jehova we ruem nti, si,

24. Nwa nke madu, ndi bi na nkpọnkpọ ebe ndia n'ala Israel nēkwu, si, Nání otù onye ka Abraham bu, o we nweta ala nka: ma ayi onwe-ayi bara uba; ayi ka enyeworo ala nka ibu ihe-nweta.

25. N'ihi nka si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Anu na ọbara-ya ka unu nēri, unu nēweli kwa anya-unu le arusi nile unu, ọbara ka unu nāwusi kwa: ọ̀ kwa ala nka ka unu gēnweta?

26. Unu eguzowo n'elu mma-agha-unu, unu emewo ihe-árú, unu emeruwo, nwoke ọ bula o merua nwunye nke nwoke-ibe-ya: ọ̀ bu kwa ala nka ka unu gēnweta?

27. Otú a ka i gāsi ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mu onwem nādi ndu, n'ezie ndi nọ na nkpọnkpọ ebe nile gāda site na mma-agha, M'gēwere kwa onye nọ n'ọhia nye anu-ọhia ka ewe ripia ya, na ndi nọ n'ebe nile ewusiri ike na n'ọb͕à nile, n'ajọ ọria nēfe efe ka ha gānwu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 33