Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 32:3-14 Bible Nso (IGBOB)

3. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M'gāchiri nkpọkọta ọtutu ndi di iche iche b͕asa ub͕um n'elu gi; ha gādọgota kwa gi n'ub͕um.

4. M'gātusa kwa gi n'ala-gi, n'ọhia ka M'gētufu gi, me kwa ka anu-ufe nile nke elu-igwe bekwasi gi, M'gēme kwa ka anu-ọhia nke uwa nka nile riju afọ site n'anu-aru-gi.

5. M'gētiyekwasi kwa anu-aru-gi n'ugwu nile, were kwa idi-elu-gi mejue ndagwurugwu nile.

6. M'gēde kwa ọbara-gi n'ala dika miri, bú ebe i nēgwu miri, rue ugwu nile; ebe nile miri si erù gējuputa na gi.

7. Mb͕e M'nēmenyu gi, M'gēkpuchi elu-igwe, me ka kpakpando nile ha jie nji; anyanwu ka M'gēkpuchi n'igwe-oji, ọnwa agaghi-enye kwa ìhè-ya.

8. Ihe nile nke nēnye ìhè n'elu-igwe ka M'gēme ka ha jie nji n'elu gi, M'gētiyekwasi kwa ọchichiri n'ala-gi; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

9. M'gākpasu kwa obi nke ọtutu ndi di iche iche, mb͕e M'gēme ka ntipia-gi bia n'etiti mba nile, rue ala di iche iche nke i nāmaghi.

10. M'gēme kwa ka i ju ọtutu ndi anya, ndi-eze-ha gāma jijiji bayere gi nke-uku, mb͕e M'gēfeghari mma-agham n'iru ha; ha gāma kwa jijiji na ntabi-anya nile ọ bula, onye ọ bula n'ihi ndu-ya, n'ubọchi nke ọdida-gi.

11. N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mma-agha nke eze Babilon gābiakwasi gi.

12. ọ bu site na mma-agha nile nke ndi-dike ka M'gēme ka ìgwè ndi-gi da; ndi kariri mba nile n'ime ka madu ma jijiji ka ha nile bu: ọ bu kwa ihe-npako nke Ijipt ka ha gāpunara ya, ewe kpochapu ìgwè ndi-ya nile.

13. M'gēme kwa ka anumanu-ya nile si n'akuku ọtutu miri la n'iyì; ukwu madu agaghi-ab͕aru kwa ha ọzọ, ukwu anumanu agaghi-ab͕aru kwa ha.

14. Mb͕e ahu ka M'gēme ka miri-ha do, me kwa ka osimiri nile ha rùe erù dika manu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 32