Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 32:14-19 Bible Nso (IGBOB)

14. Mb͕e ahu ka M'gēme ka miri-ha do, me kwa ka osimiri nile ha rùe erù dika manu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

15. Mb͕e m'gēme ala Ijipt ebe tọb͕ọrọ n'efu na ihe-iju-anya, ala b͕a aka n'ihe juru ya-ri, mb͕e M'gētib͕u ndi nile bi ya, ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

16. Abù-ákwá ka nka bu, nke ha gābù; umu-ndinyom nke mba nile gābù ya: n'ihi Ijipt na n'ihi ìgwè-ya nile ka ha gābù ya; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

17. O rue, n'arọ nke-iri-na-abua, n'ubọchi nke-iri-na-ise ọnwa ahu, na okwu Jehova rurum nti, si,

18. Nwa nke madu, bùara ìgwè ndi Ijipt abù ákwá, me ka ha rida, ya na umu-ndinyom nke mba di iche iche di ebube, rue ala di n'okpuru uwa, ha na ndi nārida n'olùlù.

19. Ònye ka i tọkariri n'utọ? rida, ka eme kwa ka i soro ndi anēbighi úgwù dina.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 32