Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 32:1-3 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, n'arọ nke-iri-na-abua, n'ọnwa nke-iri-na-abua, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na okwu Jehova rurum nti, si,

2. Nwa nke madu, buliere Fero, bú eze Ijipt, abù-ákwá, si ya, Nwa-ọdum nke mba nìle ka i yiworo: ma gi onwe-gi di ka ogologo anu n'oké osimiri nile; i we waputa n'osimiri-gi nile, ji ukwu-gi, b͕arua miri, zọrua osimiri nile ha.

3. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M'gāchiri nkpọkọta ọtutu ndi di iche iche b͕asa ub͕um n'elu gi; ha gādọgota kwa gi n'ub͕um.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 32