Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 3:24-27 Bible Nso (IGBOB)

24. Mọ Chineke we bata nimem, me ka m'guzo n'ukwum abua; O we kpayerem uka, sim, Bia, mechibido onwe-gi uzọ n'etiti ulo-gi.

25. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, le, ha gātukwasi gi udọ̀ n'aru, chiri ha ke gi ab͕u, i gaghi-apu kwa n'èzí n'etiti ha:

26. M'gēme kwa ka ire-gi rapara n'okpo-ọnu-gi, i we ghọ ob͕i, ghara iburu ha onye nādọ aka na nti: n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.

27. Ma mb͕e M'nākpayere gi uka, M'gēmeghe ọnu-gi, i we si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Onye nānu anu, ya nu; onye nāghara aghara, ya ghara: n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 3