Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 29:8-14 Bible Nso (IGBOB)

8. N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, M'gaje ime ka mma-agha biakwasi gi, M'gēbipu kwa madu na anumanu nime gi.

9. Ala Ijipt gāghọ kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu na nkpọnkpọ ebe; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova: n'ihi na ọ siwo, Mu nwe osimiri Nail, ọ bu kwa onwem mere ya.

10. N'ihi nka, le, Mu nēmegide gi, megide kwa osimiri Nail i nile, M'gēme kwa ka ala Ijipt ghọ nání nkpọnkpọ ebe nkpọnkpọ ebe na ebe tọb͕ọrọ n'efu, site na Migdol rue Sevene, ọbuná rue ókè-ala Etiopia.

11. Ọ dighi ukwu madu gāgabiga nime ya, ọ dighi kwa ukwu anumanu gāgabiga nime ya, agaghi-ebi kwa nime ya ọgu arọ abua.

12. M'gēme kwa ala Ijipt ebe tọb͕ọrọ n'efu n'etiti ala nile tọb͕ọrọ n'efu, ọzọ, obodo-ya nile nke di n'etiti obodo nile nke emeworo nkpọnkpọ ebe gābu ebe tọb͕ọrọ n'efu ọgu arọ abua: M'gāchusa kwa ndi Ijipt n'etiti mba nile, fesa ha n'ala nile.

13. N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ọgwugwu ọgu arọ abua ka M'gāchikọputa ndi Ijipt nime ndi nile di iche iche ebe achusara ha:

14. M'gēme kwa ka ndi Ijipt adọtara n'agha laghachi, M'gēme kwa ka ha laghachi n'ala Patros, n'ala nputa-n'uwa-ha; ha ewe nọ n'ebe ahu, buru ala-eze di ala.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 29