Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 29:1-15 Bible Nso (IGBOB)

1. N'arọ nke-iri, n'ọnwa nke-iri, n'ubọchi nke-iri-na-abua nke ọnwa ahu, okwu Jehova rurum nti, si,

2. Nwa nke madu, che iru-gi imegide Fero, bú eze Ijipt, bue amuma megide ya, megide kwa Ijipt nile:

3. Kwue okwu, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu nēmegide gi, Fero, eze Ijipt, bú ogologo anu ahu nke nāmakpu n'etiti osimiri Nail-ya nile, nke siworo, Mu nwe Nail nkem, ọ bu kwa mu onwem mere ya n'onwem.

4. M'gētiye kwa nb͕a-aka-imi n'àb͕à-gi abua, me ka azù nke osimiri Nail i nile rapara n'akpirikpa-gi; M'gēme kwa ka i si n'etiti osimiri Nail i nile rigoputa, gi na azù nile nke osimiri Nail i nile nke nārapara n'akpirikpa-gi.

5. M'gātusa kwa gi n'ọzara, gi na azù nile nke osimiri Nail i nile: n'ọhia ka i gāda; agaghi - achikọta gi, agaghi-ekpokọta kwa gi: anu-ọhia nke uwa na anu-ufe nke elu-igwe ka M'wereworo gi nye ka i ghọ ihe-oriri.

6. Ndi nile bi n'Ijipt gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, n'ihi na ha aburuworo ulo Israel nkpa-n'aka nke bu nání amì.

7. Mb͕e ha jidere gi n'aka, i we nyajie, dọwara ha ubu nile: na mb͕e ha dabere gi, i we b͕ajie, me ka úkwù nile guzoro ha.

8. N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, M'gaje ime ka mma-agha biakwasi gi, M'gēbipu kwa madu na anumanu nime gi.

9. Ala Ijipt gāghọ kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu na nkpọnkpọ ebe; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova: n'ihi na ọ siwo, Mu nwe osimiri Nail, ọ bu kwa onwem mere ya.

10. N'ihi nka, le, Mu nēmegide gi, megide kwa osimiri Nail i nile, M'gēme kwa ka ala Ijipt ghọ nání nkpọnkpọ ebe nkpọnkpọ ebe na ebe tọb͕ọrọ n'efu, site na Migdol rue Sevene, ọbuná rue ókè-ala Etiopia.

11. Ọ dighi ukwu madu gāgabiga nime ya, ọ dighi kwa ukwu anumanu gāgabiga nime ya, agaghi-ebi kwa nime ya ọgu arọ abua.

12. M'gēme kwa ala Ijipt ebe tọb͕ọrọ n'efu n'etiti ala nile tọb͕ọrọ n'efu, ọzọ, obodo-ya nile nke di n'etiti obodo nile nke emeworo nkpọnkpọ ebe gābu ebe tọb͕ọrọ n'efu ọgu arọ abua: M'gāchusa kwa ndi Ijipt n'etiti mba nile, fesa ha n'ala nile.

13. N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ọgwugwu ọgu arọ abua ka M'gāchikọputa ndi Ijipt nime ndi nile di iche iche ebe achusara ha:

14. M'gēme kwa ka ndi Ijipt adọtara n'agha laghachi, M'gēme kwa ka ha laghachi n'ala Patros, n'ala nputa-n'uwa-ha; ha ewe nọ n'ebe ahu, buru ala-eze di ala.

15. Ọ gādi ala kari ala-eze nile; ọ gaghi-ebuli kwa onwe-ya ọzọ n'elu mba nile: M'gēme kwa ka ha di ole-na-ole, ka ha ghara inwe ike n'aru mba nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 29