Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 25:13-17 Bible Nso (IGBOB)

13. n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a, M'gēseti kwa akam n'aru Edom, bipu nime ya madu na anumanu, me ya nkpọnkpọ ebe site na Timan; ọbuná rue Dedan ka ha gāda na mma-agha.

14. M'gēsi kwa n'aka ndim, bú Israel, tukwasi Edom ibọ̀-ọ́bọ̀m; ha ewe me n'Edom dika iwem si di na dika ọnumam si di: ha ewe mara ibọ̀-ọ́bọ̀m; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

15. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na ndi Filistia emesowo Juda n'ibọ̀-ọ́bọ̀, bọ̀ ọ́bọ̀ na nlelì nke di nime nkpuru-obi-ha ibibi ya n'iro ebighi-ebi;

16. n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a, Le, M'gaje iseti akam n'aru ndi Filistia, bipu ndi Keret, me ka ndi ọnu-miri oké osimiri fọduru la n'iyì.

17. M'gēji kwa iba-nba nile nke ọnuma bọ̀ ha ọ́bọ̀ nile di uku; ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'gātukwasi ha ibọ̀-ọ́bọ̀m.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 25