Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 24:11-22 Bible Nso (IGBOB)

11. Guzo kwa ite ahu n'elu icheku-ọku-ya nēre ere mb͕e ihe nādighi ya, ka o we di ọku, ọla-ya ewe re ọku, iru-árú-ya ab͕aze kwa n'etiti ya, ka nchara-ya we gwusia.

12. O jiwo ndọbu nile ọ nādọbu onwe-ya n'ọlu me ka ike gwu ya: ma nchara-ya nke riri nne esighi nime ya pua; n'ọku ka nchara-ya di.

13. N'iru-árú-gi ka ajọ nzube di: n'ihi na emewom ka i di ọcha ma i dighi ọcha, i gaghi-esi kwa n'iru-árú-gi di ọcha ọzọ, rue mb͕e M'gēmewori ka ọnumam zuru ike n'aru gi.

14. Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu: ọ gābia, M'gēme kwa ya; M'gaghi-arapu, M'gaghi-eme kwa ebere, M'gaghi-echèghari; dika uzọ-gi nile si di, na dika omume-gi nile si di, otú a ka ha gēkpe gi ikpe; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

15. Okwu Jehova we ruem nti, si,

16. Nwa nke madu, le, M'gaje iwere ihe-otiti napu gi onye ahu nke anya-gi nāchọsi ike: ma i gaghi-eti aka n'obi, i gaghi-akwa kwa ákwá, anya-miri agaghi-ab͕a kwa gi.

17. Ze ume, debe ọnu-gi du; i gaghi-emere ndi nwuru anwu oruru-újú, ke ihe-ike-n'isi-gi n'onwe-gi, akpukpọ-ukwu-gi ka i gētiye kwa n'ukwu-gi abua, i gaghi-ekpuchi kwa eb͕ub͕ere-ọnu-elu-gi, i gaghi-eri kwa nri ndi ọzọ.

18. M'we gwa ndi Israel okwu n'ututu; nwunyem we nwua n'anyasi: m'we me n'ututu dika ihe ahu si di enyerem n'iwu.

19. Ndi Israel we sim, Ì gaghi-egosi ayi ihe ihe ndia bu n'ebe ayi nọ, na gi onwe-gi nēme otú a?

20. M'we si ha, Okwu Jehova rurum nti, si,

21. Si ulo Israel, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, M'gaje ime ka ebe nsọm ghara idi nsọ, bú ihe-npako nke ike-unu, na ihe anya-unu abua nāchọsi ike, na ihe nke nkpuru-obi-unu nwere ọmiko n'aru ya; umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom, ndi unu rapuworo, gāda kwa site na mma-agha.

22. Ma unu gēme dika m'meworo: unu agaghi-ekpuchi eb͕ub͕ere-ọnu-elu-unu, unu agaghi-eri kwa nri nke ndi ọzọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 24