Umu Babilon we biakute ya n'ihe-ndina nke ikwa-iko, ha we merua ya n'ikwa-iko nile ha, o we rua árú site na ha, nkpuru-obi-ya we kewapu n'ebe ha nọ.