Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 21:6-20 Bible Nso (IGBOB)

6. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, ze ume; na nb͕aji úkwù na n'ilu obi ka i gēze ume n'anya-ha.

7. Ma ọ gēru, mb͕e ha gāsi gi, N'ìhi gini ka gi onwe-gi nēze ume? na i gāsi, Ọ bu n'ihi akukọ, n'ihi na ọ nābia: obi nile ọ bula gālọ kwa miri, aka nile gākuda, ike gāgwu mọ madu nile ọ bula, ikperè-ukwu nile gāghọ miri miri: le, ọ nābia, o ruwo kwa, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

8. Okwu Jehova we ruem nti, si,

9. Nwa nke madu, bue amuma, si, Otú a ka Jehova siri: Si, Le, mma-agha, le, mma-agha, amuru ya amu, ọ bu kwa ihe emere ka ọ nēb͕u maramara:

10. amuru ya amu ka o we b͕ue madu nke-uku; emere ya ka ọ nēb͕u maramara ka o we di ka àmùmà: òbi gatọ kwa ayi utọ? nkpa-n'aka nwam, ọ nāju osisi nile ọ bula.

11. Ewe were ya nye ka eme ya ka ọ nēb͕u maramara, ka ewe jide ya n'ọbu-aka: amuru nke ahu amu, bú mma-agha, eme-kwa-ra nke ahu ka ọ nēb͕u maramara, ka ewe nye ya n'aka onye nēb͕u eb͕u.

12. Tie nkpu, kwasie ákwá ike, nwa nke madu: n'ihi na nke ahu di n'aru ndim, nke ahu di n'aru ndi-isi Israel: ndi arara nye mma-agha ka ha na ndim bu: n'ihi nka tie aka n'apata-ukwu-gi.

13. N'ihi na ọnwunwa di; gini gēme kwa ma ọ buru na ọbuná nkpa-n'aka nke nāju aju ghara idi? ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

14. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, bue amuma, kukọta ọbu-aka-gi abua; ka mma-agha di okpukpu atọ, bú mma-agha nke ndi anēb͕u eb͕u: nke ahu bu mma-agha nke onye uku ahu nke anēb͕u eb͕u, nke nāb͕achibido ha buruburu.

15. Ọ bu n'akuku ọnu-uzọ-ama nile ha ka M'tiyeworo ọnu-ọnu mma-agha, ka obi we lọ ha miri, ka ewe me kwa ka ihe-isu-ngọngọ ba uba: ewó! emewo ya ka ọ ghọ àmùmà, amuru ya amu ib͕u eb͕u.

16. Me onwe-gi ka i di otù, ga n'aka-nri; do onwe-gi n'usoro, ga n'akpa-ekpe; ebe ọ bula akaworo iru-gi àkà iga.

17. Ọzọ, Mu onwem gākukọta kwa ọbu-akam abua, M'gēme kwa ka ọnumam zuru ike: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo.

18. Okwu Jehova we ruem nti, si,

19. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, mere onwe-gi uzọ abua, ka mma-agha nke eze Babilon we bia; n'otù ala ka ha abua gēsi puta: gi ka kwa akàrà yiri aka madu, ka ya n'isi uzọ obodo.

20. Uzọ ka i gēme, ka mma-agha we biarue Raba nke umu Amon, ru kwa Juda nime Jerusalem, bú ebe ewusiri ike.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 21