Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 21:21-31 Bible Nso (IGBOB)

21. N'ihi na eze Babilon guzoro n'ab͕ata uzọ, n'isi uzọ abua ahu, iju ase: o feghariri àkú-ya nile, jua ase n'aka terafim-ya, lekwasi imeju anya.

22. N'aka-nri-ya ka ihe iji ju ase bayere Jerusalem di, ido ihe di iche iche eji etipú mb͕idi, isaghe ọnu n'ob͕ub͕u, iweli olu n'iti nkpu agha, ido ihe di iche iche eji etipú mb͕idi imegide ọnu-uzọ-ama nile, iwukọta obo-ihe, iwu ulo-agha.

23. Ọ gādi-kwa-ra ha ka ọjuju-ase efu n'anya-ha, bú ndi ṅuworo ha iyi di iche iche: ma ya onwe-ya nēme ka echeta ajọ omume, ka ewe jide ha.

24. N'ihi nka otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na unu emewo ka echeta ajọ omume unu, nime nkpughe njehie nile unu, ewe hu nmehie nile unu n'omume nile unu; n'ihi na emewo ka echeta unu, ọ bu n'ọbu-aka ka agējide unu.

25. Ma gi onwe-gi, onye emeruworo aru, onye nēmebi iwu, bú onye-isi Israel, onye ubọchi-ya biaworo, na mb͕e ajọ omume nke mb͕e ikpe-azu;

26. otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Wezuga ákwà-nkukù-isi ahu, bupu okpu-eze ahu: nka agaghi-abu kwa ihe ọ bu: me ihe nke di ala ka ọ di elu, me kwa ihe nke di elu ka ọ di ala.

27. Nkpù-iru, nkpù-iru, nkpù-iru ka M'gēkpù-ya: nka kwa, ọ gaghi-adi rue mb͕e ọ gābia, bú onye o ruru aka; M'gēwere kwa ya nye ya.

28. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, bue amuma, si, Okwu di otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova kwuru bayere umu Amon, baye-kwa-ra ita-uta-ha, si; gi si kwa, Le, mma-agha, bú mma-agha nke amiputaworo, n'ihi ob͕ub͕u ka emere ya ka ọ nēb͕u maramara, otú ọ gēkwe ya inagide, ka o we di ka àmùmà:

29. mb͕e ha nāhuru gi ọhù efu, mb͕e ha nājuru gi ase okwu-ugha, itiye gi n'olu ndi nēmebi iwu ndi eb͕uru eb͕u, ndi ubọchi-ha abiawo, na mb͕e nke ajọ omume nke mb͕e ikpe-azu.

30. Mighachi ya n'ọbọ́-ya. N'ebe ekère gi, n'ala nputa-uwa-gi, ka M'gēkpe gi ikpe.

31. M'gāwukwasi gi ajọ iwem; ọku nke nrubiga-ókè nke iwem ka M'gēji fùkwasi gi: M'gēnye kwa gi n'aka ndikom bu nání anu-ọhia, ndi di ǹkà n'ibibi ebibi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 21