Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 21:17-22 Bible Nso (IGBOB)

17. Ọzọ, Mu onwem gākukọta kwa ọbu-akam abua, M'gēme kwa ka ọnumam zuru ike: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo.

18. Okwu Jehova we ruem nti, si,

19. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, mere onwe-gi uzọ abua, ka mma-agha nke eze Babilon we bia; n'otù ala ka ha abua gēsi puta: gi ka kwa akàrà yiri aka madu, ka ya n'isi uzọ obodo.

20. Uzọ ka i gēme, ka mma-agha we biarue Raba nke umu Amon, ru kwa Juda nime Jerusalem, bú ebe ewusiri ike.

21. N'ihi na eze Babilon guzoro n'ab͕ata uzọ, n'isi uzọ abua ahu, iju ase: o feghariri àkú-ya nile, jua ase n'aka terafim-ya, lekwasi imeju anya.

22. N'aka-nri-ya ka ihe iji ju ase bayere Jerusalem di, ido ihe di iche iche eji etipú mb͕idi, isaghe ọnu n'ob͕ub͕u, iweli olu n'iti nkpu agha, ido ihe di iche iche eji etipú mb͕idi imegide ọnu-uzọ-ama nile, iwukọta obo-ihe, iwu ulo-agha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 21