Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 21:1-10 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu Jehova we ruem nti, si,

2. Nwa nke madu, che iru-gi na Jerusalem, busa okwu-gi dika miri-ozuzo n'ebe ebe nsọ ya nile di, bu kwa amuma megide ala Israel;

3. si ala Israel, Otú a ka Jehova siri: Le, Mu nēmegide gi, M'gāmiputa kwa mma-agham n'ọbọ-ya, bipu nime gi onye ezi omume na onye nēmebi iwu.

4. Ebe M'gēbipu nime gi onye ezi omume na onye nēmebi iwu, n'ihi nka ka mma-agham gēsi n'ọbọ-ya puta imegide anu-aru nile, bú madu, site na Ndida rue Ugwu:

5. anu-aru nile, bú madu, ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, amiputawo mma-agham n'ọbọ-ya; ọ gaghi-alaghachi kwa ọzọ.

6. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, ze ume; na nb͕aji úkwù na n'ilu obi ka i gēze ume n'anya-ha.

7. Ma ọ gēru, mb͕e ha gāsi gi, N'ìhi gini ka gi onwe-gi nēze ume? na i gāsi, Ọ bu n'ihi akukọ, n'ihi na ọ nābia: obi nile ọ bula gālọ kwa miri, aka nile gākuda, ike gāgwu mọ madu nile ọ bula, ikperè-ukwu nile gāghọ miri miri: le, ọ nābia, o ruwo kwa, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

8. Okwu Jehova we ruem nti, si,

9. Nwa nke madu, bue amuma, si, Otú a ka Jehova siri: Si, Le, mma-agha, le, mma-agha, amuru ya amu, ọ bu kwa ihe emere ka ọ nēb͕u maramara:

10. amuru ya amu ka o we b͕ue madu nke-uku; emere ya ka ọ nēb͕u maramara ka o we di ka àmùmà: òbi gatọ kwa ayi utọ? nkpa-n'aka nwam, ọ nāju osisi nile ọ bula.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 21