Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 20:41-49 Bible Nso (IGBOB)

41. N'ísì utọ ka ihe-unu gātọm utọ, mb͕e M'mere ka unu si na ndi nile di iche iche puta, mb͕e M'chikọputara unu n'ala nile nke unu b͕asaworo nime ha; agēdokwam nsọ nime unu n'anya mba nile.

42. Unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'gēme ka unu ba n'ala Israel, n'ala ahu nke M'weliri akam elu iwere ya nye nna-unu-hà.

43. Unu gēcheta kwa n'ebe ahu uzọ nile unu, na omume nile unu, nke unu meruru onwe-unu nime ha; unu gāsọ kwa onwe-unu oyi n'iru unu n'ihi ihe ọjọ nile unu nke unu meworo.

44. Unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'mesoworo unu n'ihi aham, ọ bughi dika uzọ ọjọ nile unu si di, ọ bughi kwa dika omume nile unu nke bibiri ebibi, unu ulo Israel; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

45. Okwu Jehova we ruem nti, si,

46. Nwa nke madu, che iru-gi n'uzọ Ndida, me ka okwu-gi busa dika miri-ozuzo n'ebe Ndida di, bue amuma megide oké ọhia nke ọhia ahu di na Negeb;

47. si oké ọhia Negeb, Nuru okwu Jehova; Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, M'gaje isuye ọku nime gi, ọ gēripia kwa osisi ndu nile ọ bula na osisi nile ọ bula kpọrọ nku nke di nime gi: ire-ọku-ya nēnwu enwu, ọ gaghi-anyu anyu, ọ gāru kwa iru nile site na Negeb rue na Ugwu.

48. Anu-aru nile, bú madu, gāhu kwa na Mu onwem, bú Jehova, esuyewo ya: ọ gaghi-anyu anyu.

49. M'we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! ha nēkwu okwu bayerem, si, Ọ̀ bughi onye nātu ilu ilu ka ọ bu?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 20