Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 20:3-13 Bible Nso (IGBOB)

3. Nwa nke madu, gwa ndi-okenye Israel okwu, si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: ọ̀ bu ijum ase ka unu onwe-unu nābia? Mu onwem nādi ndu, M'gaghi-ekwe ka unu juam ase ma-ọli; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

4. Ì gēkpe ha ikpe, nwa nke madu, ì gēkpe ha ikpe? me ka ha mara ihe-árú nile nke ndi bu nna-ha;

5. si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ubọchi M'rọputara Israel, M'we weliere nkpuru ulo Jekob akam, me ka ha maram n'ala Ijipt, M'we weliere ha akam, si, Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu;

6. n'ubọchi ahu ka M'weliri akam nye ha, ime ka ha si n'ala Ijipt puta ba n'ala nke M'ledoro nye ha, nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya, nke bu ima-nma nke ala nile:

7. M'we si ha, Tufuenu, onye ọ bula ihe-árú nile nke anya-ya abua, unu eji-kwa-la arusi nile nke Ijipt merua onwe-unu; Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

8. Ha we nupu isi n'okpurum, ha ekweghi kwa igem nti; ha etufughi, onye ọ bula ihe-árú nile nke anya-ya abua, ha arapughi kwa arusi nile nke Ijipt: M'we si na M'gāwukwasi ha ọnumam, imezu iwem megide ha n'etiti ala Ijipt.

9. Ma alurum ọlu n'ihi aham, ka ewe ghara ime ya ka ọ ghara idi nsọ n'anya mba nile, ndi ha onwe-ha nọ n'etiti ha, ndi M'mere ka ha maram n'anya-ha, n'ime ka ha si n'ala Ijipt puta.

10. M'we me ka ha si n'ala Ijipt puta, M'we me ka ha ba n'ọzara.

11. M'we nye ha ukpurum nile, me ka ha mara ikpém nile, nke madu gādi kwa ndu nime ha, ma o me ha.

12. Ọzọ, ubọchi-izu-ikem nile ka M'nye-kwa-ra ha, ighọ ihe-iriba-ama n'etiti Mu na ha, ka ha we mara na Mu onwem bu Jehova, Nke nēdo ha nsọ.

13. Ulo Israel we nupu isi n'okpurum n'ọzara: ọ bughi n'ukpurum nile ka ha jeghariri, ikpém nile ka ha ju-kwa-ra, bú nke madu gādi kwa ndu nime ha, ma o me ha; ubọchi-izu-ikem nile ka ha mere ka ha ghara idi nsọ ma-ọli: M'we si na M'gāwukwasi ha ọnumam n'ọzara, ime ka ha gwusia.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 20