Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 20:26-34 Bible Nso (IGBOB)

26. M'we merua ha n'onyinye nile ha, n'ime ka nwa ọ bula nke nēmeghe àkpà-nwa mbu gabiga n'ọku, ka M'we me ka ha tọb͕ọrọ n'efu, ka ha we mara na Mu onwem bu Jehova.

27. N'ihi nka, gwa ulo Israel okwu, gi nwa nke madu, si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ bu kwa na nka ka nna-unu-hà kwulurum, n'imekpu emekpu megidem.

28. N'ihi na mb͕e M'mere ka ha ba n'ala ahu, nke M'weliri akam elu inye ha, ha we hu ugwu ntà nile ọ bula di elu, na osisi nile ọ bula b͕ara ọhia, ha we chua àjà nile ha n'ebe ahu, nye nkpasu-iwe nke onyinye-ibiaru-nso-ha n'ebe ahu, do ihe-ísì-utọ nile ha n'ebe ahu, wusi àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha n'ebe ahu.

29. M'we si ha, Gini bu ebe a di elu ebe unu onwe-unu nābà? Ewe kpọ aha-ya Bama rue ta.

30. N'ihi nka si ulo Israel, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ̀ bu n'uzọ nke nna-unu-hà ka unu onwe-unu nēmeru onwe-unu? ọ̀ bu kwa ihe-árú nile ha ka unu nākwaso iko?

31. ọzọ, mb͕e unu nēbuli onyinye nile unu, mb͕e unu nēme ka umu-unu gabiga n'ọku, ọ̀ bu na unu onwe-unu nēmeru onwe-unu n'arusi nile unu, rue ta? ma Mu onwem, #M'gēkwe ka unu juam ase, ulo Israel? Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), M'gaghi-ekwe ka unu juam ase ma-ọli:

32. ma ihe ahu nke nābà nime mọ-unu, ọ gaghi-adi ma-ọli; ọ bu na unu onwe-unu nāsi, Ayi gādi ka mba nile, dika ab͕uru nile nke ala nile, ijere osisi na nkume ozi.

33. Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), n'ezie ọ bu aka di ike, ọ bu kwa ogwe-aka esetiri eseti, ọ bu kwa ọnuma awusiri awusi, ka M'gēji buru eze-unu:

34. M'gēji kwa aka di ike, ji kwa ogwe-aka esetiri eseti, ji kwa ọnuma awusiri awusi, me ka unu si na ndi nile di iche iche puta, chikọputa kwa unu n'ala nile ebe unu b͕asaworo:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 20