Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 18:23-26 Bible Nso (IGBOB)

23. Ọ̀ nātọm utọ ma-ọli, bú ọnwu nke onye nēmebi iwu? (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): ọ̀ dighi-atọm utọ mb͕e o si n'uzọ-ya chigharia, we di ndu?

24. ma mb͕e onye ezi omume si n'ezi omume-ya chigharia, me ajọ omume, me dika ihe-árú nile si di nke onye nēmebi iwu meworo, ọ̀ gādi kwa ndu? Ezi omume-ya nile nke ọ meworo, agaghi-echeta ha: n'ihe-nmekpu-ya nke o mekpuworo, na nime nmehie-ya nke o mehieworo, nime ha ka ọ gānwu.

25. Ma unu asiwo, Adighi-atule uzọ Onye-nwe-ayi. Biko nurunu, ulo Israel: Ọ̀ bu uzọm ka anādighi-atule? ọ̀ bughi uzọ nile nke unu ka anādighi-atule?

26. Mb͕e onye ezi omume si n'ezi omume-ya chigharia, me ajọ omume, nwua n'ihi ha, n'ajọ omume-ya nke o meworo ka ọ gānwu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 18