Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 18:17-27 Bible Nso (IGBOB)

17. o siwo n'aru onye ewedara n'ala seghachi aka-ya, uma na ọmuru-nwa ka ọ nānaraghi, ikpém nile ka o meworo, n'ukpurum nile ka o jeghariworo; onye ahu agaghi-anwu n'ihi ajọ omume nke nna-ya, ọ ghaghi idi ndu.

18. Ma nna-ya, n'ihi na ọ meb͕uru nke-uku, punara nwa-nne-ya ihe n'ike, me ihe nke nādighi nma n'etiti ndi-ya, le, ọ gānwu kwa n'ajọ omume-ya.

19. Ma unu asiwo, Gini mere nwa nējighi ebu ufọdu n'ajọ omume nna-ya? Mb͕e nwa ahu meworo ihe ekpere n'ikpe na ezi omume, debe ukpurum nile, me ha, ọ ghaghi idi ndu.

20. Nkpuru-obi ahu nke nēmehie, ya onwe-ya gānwu: nwa agaghi-ebu ufọdu n'ajọ omume nna-ya, nna agaghi-ebu kwa ufọdu n'ajọ omume nwa-ya; ezi omume nke onye ezi omume gādi n'isi ya, nmebi-iwu nke onye nēmebi iwu gādi kwa n'isi ya.

21. Ma onye nēmebi iwu, mb͕e ọ gēsi na nmehie-ya nile nke o meworo chigharia, debe ukpurum nile, me ihe ekpere n'ikpe na ezi omume, ọ ghaghi idi ndu, ọ gaghi-anwu.

22. Njehie-ya nile nke o meworo, agaghi-echeta ha megide ya: n'ezi omume-ya nke o meworo ka ọ gādi ndu.

23. Ọ̀ nātọm utọ ma-ọli, bú ọnwu nke onye nēmebi iwu? (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): ọ̀ dighi-atọm utọ mb͕e o si n'uzọ-ya chigharia, we di ndu?

24. ma mb͕e onye ezi omume si n'ezi omume-ya chigharia, me ajọ omume, me dika ihe-árú nile si di nke onye nēmebi iwu meworo, ọ̀ gādi kwa ndu? Ezi omume-ya nile nke ọ meworo, agaghi-echeta ha: n'ihe-nmekpu-ya nke o mekpuworo, na nime nmehie-ya nke o mehieworo, nime ha ka ọ gānwu.

25. Ma unu asiwo, Adighi-atule uzọ Onye-nwe-ayi. Biko nurunu, ulo Israel: Ọ̀ bu uzọm ka anādighi-atule? ọ̀ bughi uzọ nile nke unu ka anādighi-atule?

26. Mb͕e onye ezi omume si n'ezi omume-ya chigharia, me ajọ omume, nwua n'ihi ha, n'ajọ omume-ya nke o meworo ka ọ gānwu.

27. Ma mb͕e onye nēmebi iwu si na nmebi-iwu-ya nke o meworo chigharia, me ihe ekpere n'ikpe na ezi omume, ya onwe-ya gēme ka nkpuru-obi-ya di ndu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 18