Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 16:7-18 Bible Nso (IGBOB)

7. Ihe bara uba dika ihe-opupú nke ọhia ka M'meworo gi, i we ba uba, bùe ibù, biarue n'ihe-ichọ-nma kachasi ihe-ichọ-nma nile; i kpuru ara, agiri-isi-gi puchi-kwa-ra epuchi; ma gi onwe-gi b͕asiri ọtọ.

8. M'we gabiga n'akuku gi, hu gi, ma, le, mb͕e-gi bu mb͕e ihe-gi nātọ utọ; M'we b͕asa ọnu-ọnu-ala uwe-nwudam n'aru gi, kpuchie ọtọ-gi, ṅuara gi iyi, Mu na i we b͕a ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), i we ghọ onye nkem.

9. M'we sa gi miri, sachapu ọbara-gi n'aru gi, te gi manu.

10. M'we yibe gi uwe akpara nke-ọma, yibe gi akpukpọ seal n'ukwu, chiri ezi ákwà ọcha ke gi n'úkwù, b͕okwasi gi nkisi.

11. M'we ke gi ihe-ichọ-nma, tiye ọla-aka n'aka-gi abua, na iyab͕a n'olu-gi.

12. M'we tiye nb͕a-aka n'imi-gi, na nb͕a-aka-nti na nti-gi abua, na okpu-eze mara nma n'isi-gi.

13. Ewe ke gi ihe-ichọ-nma nke ọla-edo na ọla-ọcha; uwe-oyiyi-gi bu kwa ezi ákwà ọcha na nkisi na uwe akpara nke-ọma; utu ọka flour na manu-aṅu na manu ka i riri: i we mab͕ue onwe-gi na nma, o we gara gi nke-ọma, i we rue ala-eze.

14. Aha i nwere we pua ba n'etiti mba nile n'ihi nma-gi; n'ihi na ihe zuru okè ka ọ bu, n'ihi ima-nmam nke M'tukwasiri gi; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

15. I we tukwasi nma-gi obi, kwa iko n'ihi aha-gi, wukwasi ikwa-iko-gi nile n'aru onye ọ bula nāgabiga; nke ya ka ọ bu.

16. I we chiri uwe-gi ufọdu, mere onwe-gi ebe di iche iche di elu nke aturu agwa, i we kwa iko n'elu ha: ihe di otú a ekwesighi ibia, ọ gaghi-adi kwa otú a.

17. I we chiri ihe-gi nile mara nma nke sitere n'ọla-edom na n'ọla-ọcham, nke M'nyere gi, i we mere onwe-gi onyinyo di iche iche nke nwoke, kwaso ha iko,

18. chiri uwe-gi nke akpara nke-ọma, kpuchie ha, ọ bu kwa manum na ihe-nsure-ọkum nēsì ísì utọ ka i chere n'iru ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 16