Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 16:24-39 Bible Nso (IGBOB)

24. na i wuworo onwe-gi ulo ikwa iko, me-kwa-ra onwe-gi ebe di elu n'amá nile ọ bula.

25. N'isi-uzọ nile ọ bula ka i wuworo ebe-gi di elu, i we me ka nma-gi ghọ ihe-árú, i we ghebere onye-ngabiga ọ bula ukwu-gi abua, me ka ikwa-iko-gi ba uba.

26. I we kwaso umu Ijipt, bú ndi-ab͕ata-obi-gi, ndi anu-aru-ha di uku, iko, me ka ikwa-iko-gi ba uba, ikpasum iwe.

27. Ma, le, esetiwom akam imegide gi, M'we bilata òkè nri-gi, rara gi nye n'aka ọchichọ nkpuru-obi ndi nākpọ gi asì, bú umu-ndinyom ndi Filistia, ndi ihere uzọ ajọ nzube gi mere.

28. I we kwaso umu Asiria iko, n'ihi na afọ ejughi gi; e, i kwasoro ha iko, ma afọ ejughi kwa gi.

29. I we me ka ikwa-iko-gi ba uba n'ebe ala ndi-ahia di, rue Kaldea; ma ọbuná na nka ka afọ nējughi gi.

30. Le, ka obi-gi si ata aru nke-uku! (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ọ bu na i nēme ihe ndia nile, bú ọlu nwanyi nākwa iko nke nēme ka o si tọ ya;

31. ọ bu na i nēwu ulo ikwa-iko gi n'isi uzọ nile ọ bula, ebe-gi di elu ka i mewo-kwa-ra n'amá nile ọ bula; ma i dighi ka nwanyi nākwa iko n'ichì onyinye ọchì.

32. Le nwanyi nākwa iko! mb͕e ọ nọ n'okpuru di-ya ọ nēwere ndi nābughi di-ya!

33. Ndinyom nile nke nākwa iko ka ha nēnye onyinye: ma gi onwe-gi enyewo ndikom nile nāhu gi n'anya onyinye-gi nile, i we go ha ngo, ka ha si n'ebe nile di buruburu biakute gi n'ihi ikwa-iko-gi nile.

34. Gi na ndinyom ọzọ we di iche n'ikwa-iko-gi nile otú a, na ọ dighi onye nākwaso gi iko: na ebe i nēnye onyinye, ma ọ dighi onyinye enyeworo gi, i we ghọ onye di iche.

35. N'ihi nka, gi nwanyi nākwa iko, nuru okwu Jehova:

36. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, N'ihi na awusiwo ọla-gi, na n'ihi na ekpughepuru ọtọ-gi site n'ikwa-iko-gi nile i nākwaso ndi nāhu gi n'anya; na n'ihi arusi nile nke ihe-árú-gi nile, na dika ọbara umu-gi si di, nke i nyere ha;

37. n'ihi nka, le, M'gaje ichikọta ndi nile nāhu gi n'anya, ndi ihe-gi nātọ ha utọ, na ndi nile i huworo n'anya, ha na ndi nile i kpọworo asì; ọ bu na M'gāchikọta ha imegide gi buruburu, M'gēkpughe-kwa-ra ha ọtọ-gi, ka ha we hu ọtọ-gi nile.

38. M'gēkpe kwa gi ikpe nile nke ndi bu nwunye nākwa iko, ndi nāwusi kwa ọbara; M'gēwere kwa gi nye ka i buru ọbara nke ọnuma na nke ekworo.

39. M'gēnye kwa gi n'aka-ha, ha ewe kwatue ulo ikwa-iko gi, tikpọ ebe-gi nile di elu, yipu uwe-gi nile n'aru-gi, chiri ihe-gi nile mara nma: ha gārapu gi i b͕arasia ọtọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 16