Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 16:15-32 Bible Nso (IGBOB)

15. I we tukwasi nma-gi obi, kwa iko n'ihi aha-gi, wukwasi ikwa-iko-gi nile n'aru onye ọ bula nāgabiga; nke ya ka ọ bu.

16. I we chiri uwe-gi ufọdu, mere onwe-gi ebe di iche iche di elu nke aturu agwa, i we kwa iko n'elu ha: ihe di otú a ekwesighi ibia, ọ gaghi-adi kwa otú a.

17. I we chiri ihe-gi nile mara nma nke sitere n'ọla-edom na n'ọla-ọcham, nke M'nyere gi, i we mere onwe-gi onyinyo di iche iche nke nwoke, kwaso ha iko,

18. chiri uwe-gi nke akpara nke-ọma, kpuchie ha, ọ bu kwa manum na ihe-nsure-ọkum nēsì ísì utọ ka i chere n'iru ha.

19. Nrim kwa nke M'nyere gi, bú utu ọka flour na manu na manu-aṅu, nke M'mere ka i rie, i che-kwa-ra ya n'iru ha ibu ísì utọ, o we di otú a; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

20. I we chiri umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom, ndi i muworom, i we chiri ha chuara ha àjà, ka ewe ripia ha. Ọ̀ bu ihe ntà, bú okwu ikwa-iko-gi nile,

21. na i b͕uworo umum, rara ha nye, n'ime ka ha gabigakuru ha n'ọku?

22. Ma n'ihe-árú-gi nile na ikwa-iko-gi nile i chetaghi ubọchi nile mb͕e i di na nwata, mb͕e i b͕asiri ọtọ, onye anāzọtọ n'ọbara-gi ka i bu kwa.

23. O rue, mb͕e ihe ọjọ gi nile gasiri, (ahuhu, ahuhu diri gi! ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta,)

24. na i wuworo onwe-gi ulo ikwa iko, me-kwa-ra onwe-gi ebe di elu n'amá nile ọ bula.

25. N'isi-uzọ nile ọ bula ka i wuworo ebe-gi di elu, i we me ka nma-gi ghọ ihe-árú, i we ghebere onye-ngabiga ọ bula ukwu-gi abua, me ka ikwa-iko-gi ba uba.

26. I we kwaso umu Ijipt, bú ndi-ab͕ata-obi-gi, ndi anu-aru-ha di uku, iko, me ka ikwa-iko-gi ba uba, ikpasum iwe.

27. Ma, le, esetiwom akam imegide gi, M'we bilata òkè nri-gi, rara gi nye n'aka ọchichọ nkpuru-obi ndi nākpọ gi asì, bú umu-ndinyom ndi Filistia, ndi ihere uzọ ajọ nzube gi mere.

28. I we kwaso umu Asiria iko, n'ihi na afọ ejughi gi; e, i kwasoro ha iko, ma afọ ejughi kwa gi.

29. I we me ka ikwa-iko-gi ba uba n'ebe ala ndi-ahia di, rue Kaldea; ma ọbuná na nka ka afọ nējughi gi.

30. Le, ka obi-gi si ata aru nke-uku! (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ọ bu na i nēme ihe ndia nile, bú ọlu nwanyi nākwa iko nke nēme ka o si tọ ya;

31. ọ bu na i nēwu ulo ikwa-iko gi n'isi uzọ nile ọ bula, ebe-gi di elu ka i mewo-kwa-ra n'amá nile ọ bula; ma i dighi ka nwanyi nākwa iko n'ichì onyinye ọchì.

32. Le nwanyi nākwa iko! mb͕e ọ nọ n'okpuru di-ya ọ nēwere ndi nābughi di-ya!

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 16