Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 16:10-22 Bible Nso (IGBOB)

10. M'we yibe gi uwe akpara nke-ọma, yibe gi akpukpọ seal n'ukwu, chiri ezi ákwà ọcha ke gi n'úkwù, b͕okwasi gi nkisi.

11. M'we ke gi ihe-ichọ-nma, tiye ọla-aka n'aka-gi abua, na iyab͕a n'olu-gi.

12. M'we tiye nb͕a-aka n'imi-gi, na nb͕a-aka-nti na nti-gi abua, na okpu-eze mara nma n'isi-gi.

13. Ewe ke gi ihe-ichọ-nma nke ọla-edo na ọla-ọcha; uwe-oyiyi-gi bu kwa ezi ákwà ọcha na nkisi na uwe akpara nke-ọma; utu ọka flour na manu-aṅu na manu ka i riri: i we mab͕ue onwe-gi na nma, o we gara gi nke-ọma, i we rue ala-eze.

14. Aha i nwere we pua ba n'etiti mba nile n'ihi nma-gi; n'ihi na ihe zuru okè ka ọ bu, n'ihi ima-nmam nke M'tukwasiri gi; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

15. I we tukwasi nma-gi obi, kwa iko n'ihi aha-gi, wukwasi ikwa-iko-gi nile n'aru onye ọ bula nāgabiga; nke ya ka ọ bu.

16. I we chiri uwe-gi ufọdu, mere onwe-gi ebe di iche iche di elu nke aturu agwa, i we kwa iko n'elu ha: ihe di otú a ekwesighi ibia, ọ gaghi-adi kwa otú a.

17. I we chiri ihe-gi nile mara nma nke sitere n'ọla-edom na n'ọla-ọcham, nke M'nyere gi, i we mere onwe-gi onyinyo di iche iche nke nwoke, kwaso ha iko,

18. chiri uwe-gi nke akpara nke-ọma, kpuchie ha, ọ bu kwa manum na ihe-nsure-ọkum nēsì ísì utọ ka i chere n'iru ha.

19. Nrim kwa nke M'nyere gi, bú utu ọka flour na manu na manu-aṅu, nke M'mere ka i rie, i che-kwa-ra ya n'iru ha ibu ísì utọ, o we di otú a; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

20. I we chiri umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom, ndi i muworom, i we chiri ha chuara ha àjà, ka ewe ripia ha. Ọ̀ bu ihe ntà, bú okwu ikwa-iko-gi nile,

21. na i b͕uworo umum, rara ha nye, n'ime ka ha gabigakuru ha n'ọku?

22. Ma n'ihe-árú-gi nile na ikwa-iko-gi nile i chetaghi ubọchi nile mb͕e i di na nwata, mb͕e i b͕asiri ọtọ, onye anāzọtọ n'ọbara-gi ka i bu kwa.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 16