Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 16:1-12 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu Jehova we ruem nti, si,

2. Nwa nke madu, me ka Jerusalem mara ihe-árú-ya nile,

3. si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri Jerusalem: Nputa-uwa-gi na ọmumu-gi sitere n'ala ndi Kenean; nna-gi ka onye-Amorait bu, ọ bu kwa nne-gi ka onye Het bu.

4. Ma ọmumu-gi, n'ubọchi amuru gi ebìghi otubo-gi, ejighi kwa miri sa gi aru isacha gi; eteghi i nnú ma-ọli, ekeghi kwa gi ákwà-ọkiké ma-ọli.

5. Ọ dighi anya mere gi ebere, imere gi otù ihe n'ihe ndia, inwe ọmiko n'aru gi; ma atufuru gi n'ọhia, n'ihi na asọwo gi onwe-gi oyi n'ubọchi amuru gi.

6. M'we gabiga n'akuku gi, hu gi ka anāzọtọ gi n'ọbara-gi, M'we si gi, Ọ bu ezie na i nọ nime ọbara-gi, di ndu; e, asirim gi, Ọ bu ezie na i nọ nime ọbara-gi, di ndu.

7. Ihe bara uba dika ihe-opupú nke ọhia ka M'meworo gi, i we ba uba, bùe ibù, biarue n'ihe-ichọ-nma kachasi ihe-ichọ-nma nile; i kpuru ara, agiri-isi-gi puchi-kwa-ra epuchi; ma gi onwe-gi b͕asiri ọtọ.

8. M'we gabiga n'akuku gi, hu gi, ma, le, mb͕e-gi bu mb͕e ihe-gi nātọ utọ; M'we b͕asa ọnu-ọnu-ala uwe-nwudam n'aru gi, kpuchie ọtọ-gi, ṅuara gi iyi, Mu na i we b͕a ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), i we ghọ onye nkem.

9. M'we sa gi miri, sachapu ọbara-gi n'aru gi, te gi manu.

10. M'we yibe gi uwe akpara nke-ọma, yibe gi akpukpọ seal n'ukwu, chiri ezi ákwà ọcha ke gi n'úkwù, b͕okwasi gi nkisi.

11. M'we ke gi ihe-ichọ-nma, tiye ọla-aka n'aka-gi abua, na iyab͕a n'olu-gi.

12. M'we tiye nb͕a-aka n'imi-gi, na nb͕a-aka-nti na nti-gi abua, na okpu-eze mara nma n'isi-gi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 16