Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 14:22-23 Bible Nso (IGBOB)

22. Ma, le, ndi b͕apuru ab͕apu gāfọdu nime ya, ndi anēme ka ha puta, bú umu-ndikom na umu-ndinyom: le, ha nāpukute unu, unu gāhu kwa uzọ-ha na omume nile ha: ewe kasie unu obi bayere ihe ọjọ ahu nke M'meworo ka ọ biakwasi Jerusalem, bú ihe ahu nile nke M'meworo Ka ọ biakwasi ya.

23. Ha gākasi kwa unu obi, mb͕e unu nāhu uzọ-ha na omume nile ha: unu ewe mara na ọ bughi n'efu ka M'meworo ihe ahu nile nke M'meworo nime ya; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 14