Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 14:1-15 Bible Nso (IGBOB)

1. Ufọdu nime ndi-okenye Israel we biakutem, nọdu ala n'irum.

2. Okwu Jehova we ruem nti, si,

3. Nwa nke madu, ndikom ndia emewo ka arusi nile ha ba n'obi-ha, ọ bu kwa ihe-isu-ngọngọ nke ajọ omume-ha ka ha tiyere na ncherita-iru ha: #M'gēkwe ka ha juam ase ma-ọli?

4. N'ihi nka gwa ha okwu, si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Onye ọ bula n'ulo Israel nke nēme ka arusi nile ya ba n'obi-ya, nke nētiye kwa ihe-isu-ngọngọ nke ajọ omume-ya na ncherita-iru ya, we biakute onye-amuma; Mu onwem, bú Jehova, gāza ya dika o si di, ya bu dika iba-uba nke arusi-ya nile si di;

5. ka M'we jide ulo Israel n'obi-ha, n'ihi na ha esiwo n'ebe M'nọ ghọ ndi ala ọzọ site n'arusi nile ha.

6. N'ihi nka si ulo Israel, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Latanu, sinu n'arusi nile unu chigharia; si-kwa-nu n'ihe-árú nile unu chigharia iru-unu.

7. N'ihi na onye ọ bula n'ulo Israel, ma-ọbu onye ọ bula nime ndi-ọbìa nke nọ dika ọbìa n'Israel, nke nēkewapu onwe-ya n'isom, we me ka arusi nile ya ba n'obi-ya, nke nētiye kwa ihe-isu-ngọngọ nke ajọ omume-ya na ncherita-iru ya, we biakute onye-amuma iju ase bayerem n'aka ya; Mu onwem, bú Jehova, gāza ya n'Onwem:

8. M'gēdo kwa irum megide onye ahu, me ya ka ọ buru ihe-iju-anya, ka ọ ghọ ihe-iriba-ama na ilu, M'gēbipu kwa ya n'etiti ndim; unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

9. Ma onye-amuma ahu, mb͕e agārafu ya, o we kwue okwu, Mu onwem, bú Jehova, arafuwo onye-amuma ahu, M'gēsetipu kwa akam n'aru ya, kpochapu ya n'etiti ndim, bú Israel.

10. Ha gēbu kwa ajọ omume-ha: dika ajọ omume nke onye nāju ase, otú a ka ajọ omume nke onye-amuma gādi;

11. ka ulo Israel we ghara ikpafu kwa ọzọ n'isom, ghara kwa iwere njehie nile ha merua onwe-ha ọzọ; ha ewe ghọrọm otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra ha Chineke; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

12. Okwu Jehova we ruem nti, si,

13. Nwa nke madu, mb͕e ala ọ bula nēmehie megidem n'imekpu ihe-nmekpu, M'we setipu akam imegide ya, b͕ajiere ya nkpa-n'aka, bú achicha, zite oké unwu nime ya, bipu madu na anumanu nime ya;

14. asi na ndikom atọ ndia, bú Noa na Daniel na Job, nọ n'etiti ya, ha onwe-ha gēji ezi omume-ha naputa nání nkpuru-obi-ha; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

15. Asi na emem ka ajọ anu-ọhia gabiga n'ala ahu, ha we b͕aba ya aka, o we ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye ọ bula nāgabiga ya n'ihi anu-ọhia ahu;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 14