Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 13:7-13 Bible Nso (IGBOB)

7. Ọ̀ bughi ọhù efu ka unu huworo, ọ̀ bughi kwa okwu iju-ase ugha ka unu kwuworo, mb͕e unu nāsi, Ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta; ma Mu onwem ekwughi okwu?

8. N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N'ihi na unu ekwuwo okwu efu, hu ọhù ugha, n'ihi nka, le, Mu nēmegide unu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

9. Akam gādi kwa imegide ndi-amuma ahu ndi nāhu ọhù efu, ndi nāju kwa ase ugha: ha agaghi-adi n'ìzù nzuzo nke ndim, agaghi-ede kwa ha n'odide-akwukwọ ulo Israel, ha agaghi-abà kwa n'ala Israel; unu ewe mara na Mu onwem bu Onye-nwe-unu Jehova.

10. N'ihi na, ọ bu n'ihi na ha ewezugawo ndim, si, Udo; ma udo adighi; ndim ahu nālu kwa mb͕idi nādighi ike, ma, le, ha nēte ya nzu:

11. gi si ndi nēte ya nzu, na ọ gāda: oké miri-ozuzo nke nēzobiga ókè gēzo; unu onwe-unu kwa, oké ákú-miri-ígwé, gāda; oké ifufe gāb͕awa kwa ya.

12. Ma, le, mb͕idi ahu adawo, àgaghi-asi unu, Òle ebe otite ahu nke unu teworo?

13. N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a; M'gēwere kwa oké ifufe b͕awa ya n'ọnumam; oké miri-ozuzo nke nēzobiga ókè gēzo kwa n'iwem, na oké ákú-miri-ígwé n'ọnumam ime ka ọ gwusia.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 13