Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 13:7-10 Bible Nso (IGBOB)

7. Ọ̀ bughi ọhù efu ka unu huworo, ọ̀ bughi kwa okwu iju-ase ugha ka unu kwuworo, mb͕e unu nāsi, Ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta; ma Mu onwem ekwughi okwu?

8. N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N'ihi na unu ekwuwo okwu efu, hu ọhù ugha, n'ihi nka, le, Mu nēmegide unu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

9. Akam gādi kwa imegide ndi-amuma ahu ndi nāhu ọhù efu, ndi nāju kwa ase ugha: ha agaghi-adi n'ìzù nzuzo nke ndim, agaghi-ede kwa ha n'odide-akwukwọ ulo Israel, ha agaghi-abà kwa n'ala Israel; unu ewe mara na Mu onwem bu Onye-nwe-unu Jehova.

10. N'ihi na, ọ bu n'ihi na ha ewezugawo ndim, si, Udo; ma udo adighi; ndim ahu nālu kwa mb͕idi nādighi ike, ma, le, ha nēte ya nzu:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 13